Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 48:8 - Bible Nso

8 Otú ọ di, i nughi; i maghi kwa; site kwa na mb͕e ochie nti-gi egheghi oghe: n'ihi na amaram na i nāghọb͕u nke-uku, ọzọ, Onye nējehie ejehie site n'afọ nne-ya, ka anākpọ gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 E, ị nụbeghị, ị maghịkwa, site na mgbe ochie ntị gị egheghị oghe. Nʼihi na amaara m na ị bụ onye aghụghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye a na-akpọ onye nnupu isi site nʼafọ nne ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 48:8
33 Iomraidhean Croise  

Àjà na onyinye-inata-iru-ọma adighi-atọ Gi utọ; Nti abua ka I ràpúworom: Ọ bughi àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie ka I chọworo.


Le, n'ajọ omume ka amuputaram; Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem.


Emewo ka ndi nēmebi iwu buru ndi ala ọzọ site n'àkpà-nwa: Ha akpafuwo site n'afọ nne-ha, nēkwu okwu-ugha.


Ọhù siri ike ka egosiworom; onye-nghọb͕u nāghọb͕u, onye nāpunara madu ihe nāpunara madu ihe. Rigo, gi Ilam; nọchigide n'agha, gi Midia; ize-ume-ya nile ka M'meworo ka ọ kwusi.


Jehova, ebuliwo aka-Gi, ma ha adighi-ahu: ha gāhu ekworo I nēkworo ndi-Gi, ihere ewe me ha; ọzọ, ọku nke ndi nēmegide Gi gērichapu ha.


Ahuhu gādiri gi onye nāpunara madu ihe, ma gi onwe-gi bu onye anāpunaraghi ihe; onye nāghọb͕u kwa aghọb͕u, ma ha aghọb͕ughi gi! mb͕e i napubìri madu ihe, agāpunara gi ihe; mb͕e i ghọb͕ubìri, ha gāghọb͕u gi.


O we wukwasi ya ọnuma nke iwe-Ya, na ike nke agha; nke ahu we suye ya ọku buruburu, ma ọ maghi; o we re ya ọku, ma ọ dighi-atughari obi-ya na ya.


Chetanu nka, jisi-kwa-nu ike: menu ka ọ biaghachi n'obi, unu ndi-njehie.


Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n'iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi.


N'ihi na M'mara na onye siri ike ka i bu, na ọ bu akwara ígwè ka olu-gi bu, na egedege-iru-gi bu kwa ọla;


Ub͕u a ka ekèworo ha, ọ bughi site na mb͕e ochie; ọzọ, tutu ubọchi ta erue i nughi kwa ha;ka i we ghara isi, Le, amaram ha.


Onye-nwe-ayi Jehova emegheworom ntim, ma Mu onwem enupugh isi, alaghachighm azu.


Ònye ka ọ nātọ unu utọ imegide? ònye ka unu nāsaghepu ọnu mbara, riputasi kwa ire, imegide? ùnu onwe-unu abughi umu njehie, nkpuru okwu-ugha,


N'ezie dika nwayi si ewere nghọb͕u rapu di-ya, otú a ka unu ghọb͕uworom, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi na ulo Israel na ulo Juda aghọb͕uwom nke-uku, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Biko, nurunu nka, unu ndi di nzuzu, nke obi amam-ihe nādighi; anya abua ka ha nwere, ma ha adighi-ahu uzọ; nti abua ka ha nwere, ma ha adighi-anu ihe:


Ònye ka M'gāgwa okwu, b͕a kwa àmà, ka ha we nu? le, ihe anēbighi ùgwù ka nti-ha bu, ha apughi kwa iṅa nti: le, okwu Jehova aghọworo ha ihe-ita-uta; ọ dighi-atọ ha utọ.


Jehova ka ha ghọb͕uworo; n'ihi na umu nābughi nke Ya ka ha muworo: ub͕u a ka ọnwa ọhu gēripia ha, ha na òkè nile ha.


Ma ndi ahu agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, dika Adam: n'ebe ahu ka ha ghọb͕uworom.


Ndi ala ọzọ eripiawo ike-ya, ma ya onwe-ya amagh: e, efesawo ya isi-awọ, ma ya onwe-ya amaghi.


Juda aghọḅuwo nghọḅu, ọ bu kwa ihe-árú ka emeworo n'Israel na nime Jerusalem; n'ihi na Juda emewo ka idi-nsọ Jehova nke Ọ huworo n'anya ghara idi nsọ, ọ luwo kwa nwa-nwan yi nke chi ala ọzọ.


ndi ayi onwe-ayi nile bi-kwa-ra obi n'etiti ha n'oge gara aga nime agu ihe ọjọ nke anu-aru-ayi, nēme ihe nile anu-aru-ayi na èchìchè-uche-ayi chọrọ, buru kwa umu nke iwe dika esi mu ayi, dika ndi fọduru bu kwa:


Jehova we si Moses, Le, gi na nna-gi-hà ganēdina; ndi nka gēbili kwa, soro chi ala ọzọ nile nke ala ahu kwa iko, bú ebe ha onwe-ha nābà n'etiti ya, ha gārapukwam, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum nke Mu nà ha b͕ara.


Mu onwem aghaghi kwa izo irum n'ubọchi ahu n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo, n'ihi na ha echewo chi di iche iche ọzọ iru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan