Onye-nnọkwasi-inyinya we je izute ya, si, Otú a ka eze siri. Ùdo di kwa? Jihu we si, Gini ka gi na udo nwekọrọ? chigharia ga n'azum. Onye-nche ahu we gosi, si, Onye-ozi-ayi biakutere ha, ma ọ lataghi.
Genum nti, unu agwe-etiti; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi di iche iche, site n'ebe di anya: Jehova esitewo na mb͕e m'nọ n'afọ kpọm; site na mb͕e m'nọ n'afọ nnem ka O hotaworo aham:
Ha gāpu kwa, lekwasi ozu nile nke ndi nējehie ejehie megidem: n'ihi na ikpuru-ha agaghi-anwu, ọku-ha agaghi-anyu kwa; ha gābu-kwa-ra anu-aru nile ihe isọ oyi.