Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 48:21 - Bible Nso

21 Akpiri akpọghi ha nku mb͕e O mere ka ha je ije n'ala kpọrọ nku: O mere ka miri si n'oké nkume rùputara ha: e, Ọ kpọwara oké nkume, miri we suputa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Mgbe O duuru ndị ya jee ije nʼọzara, ala kpọrọ nkụ, akpịrị akpọghị ha nkụ. O mere ka mmiri si nʼoke nkume sọpụtara ha, e, ọ kpọwara oke nkume mee ka mmiri sọpụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 48:21
15 Iomraidhean Croise  

ọ bu kwa nri nke sitere n'elu-igwe ka I nyere ha bayere agu-ha, me kwa ka miri si na nkume di elu putara ha bayere akpiri-ikpọ-nku-ha, I si-kwa-ra ha ba nime inweta ala ahu nke I weliri aka-Gi inye ha.


I nye-kwa-ra ezi Mọ nke Gi ime ka ha nwe uche, I b͕ochighi kwa manna-Gi n'ọnu-ha, I nye-kwa-ra ha miri bayere akpiri-ikpọ-nku-ha.


O meghere oké nkume, miri we rùputa; Ha nērù n'ala ọkpọ-nku dika osimiri.


Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi: Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ.


Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara, We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta.


O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta, O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri.


Le, O tiri oké nkume ihe, miri we nērù erù, Isi-iyi di iche iche nērubiga kwa ókè; Ọ̀ di kwa achicha Ọ puru inye? Ọ̀ gēdoziri ndi-Ya anu?


Le, M'gaje iguzo n'iru gi n'ebe ahu n'elu oké nkume nime Horeb, i gēti oké nkume ahu ihe, miri gēsi kwa nime ya puta, ka ndim we ṅua. Moses we me otú a n'anya ndi-okenye Israel.


N'elu ugwu ọ bula di elu na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu ka iyi na ebe miri nērù gādi, n'ubọchi nke oké ob͕ub͕u, mb͕e ulo-elu nile gāda.


Agu agaghi-agu ha, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku; miri na anyanwu agaghi-amab͕u kwa ha: n'ihi na Onye nwere obi-ebere n'aru ha gēdu ha, ọ bu kwa n'akuku isi-iyi nile juputara na miri ka O gēdu ha nwayọ.


N'ikwa-ákwá ka ha gābia, ọ bu kwa n'aririọ-amara nile ka M'gēduru ha: M'gēme ka ha jerue iyi di iche iche juputara na miri, n'uzọ ziri ezi, nke ha nāgaghi-asu ngọngọ nime ya: n'ihi na aghọworom Israel nna, ma Efraim, ọkparam ka ọ bu.


Moses we welie aka-ya were nkpa-n'aka-ya tie nkume ahu di elu ub͕ò abua: miri riri nne we puta, nzukọ ahu we ṅua, ha na anu-ulo nile ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan