Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 48:20 - Bible Nso

20 Sinu na Babilon pua, b͕anarinu ndi Kaldea; werenu olu nke iti-nkpu-ọṅù gosi, me ka anuru nka, menu ka ọ puta ìhè rue nsọtu uwa: sinu, Jehova ab͕aputawo orù-Ya, bú Jekob.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Sitenụ na Babilọn pụọ, gbanarịnụ ndị Kaldịa! Werenụ olu iti mkpu ọṅụ kwusaa inwere onwe unu a. Meenụ ka ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa nụrụ ya sịnụ, “Onyenwe anyị agbapụtala ohu ya Jekọb.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 48:20
39 Iomraidhean Croise  

Ma òle mba di ka ndi-Gi, dika Israel, bú otù mba nke nēguzo iche n'uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ka ọ buru otù ndi, na imere Onwe-ya aha, na imere unu ihe-idi-uku a, na imere ala-Gi ihe di egwu, n'iru ndi-Gi, nke I siri n'Ijipt, bú mba di iche iche ọzọ na chi nile ha, baputara onwe-gi?


Ma ndia bu umu ala ahu anāchi achi ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n'agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri na Babilon, ha we laghachi na Jerusalem na Juda, nwoke ọ bula n'obodo-ya;


Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata, Ayi di ka ndi nārọ nrọ.


I gāsi kwa n'ubọchi ahu, M'gēkele Gi, Jehova; N'ihi na ọ bu ezie na I wesaram iwe, ma iwe-Gi alaghachiwo azu, I we kasiem obi.


Unu gāsi kwa n'ubọchi ahu, Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya, menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche, hotanu na emewo ka aha-Ya di elu.


Ndi ahu gēbuli olu-ha, ha gēti nkpu ọṅù; n'ihi nbili-elu Jehova ha gēsi n'oké osimiri tisie nkpu ike.


N'ubọchi ahu ka agābù abù a n'ala Juda: Obodo siri ike ka ayi nwere; nzọputa ka O gēdo ka ọ buru mb͕idi-ya nile na ékpè-ya.


Bùkuenu Jehova abù ọhu, kwusanu otuto-Ya site na nsọtu uwa; unu ndi nārida n'oké osimiri, na ùjú-ya, agwe-etiti nile, na ndi bi ha.


Ma ub͕u a, otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Jekob, Nke kpuwo-kwa-ra gi, Israel: Atula egwu, n'ihi na ab͕aputawom i; akpọwom i n'aha-gi, nkem ka i bu.


Ehichapuwom njehie-gi nile, dika oké igwe-oji, hichapu kwa nmehie-gi nile, dika igwe-oji: Iaghachikutem; n'ihi na ab͕aputawom i.


I nuwo ya; gi le ihe a nile; unu onwe-unu kwa, ùnu agaghi-egosi ya? Emewom ka i nuru ihe ọhu di iche site n'ub͕u a, bú ihe echebeworo na nzuzo, nke i nāmaghi.


Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe; tegharia egwú ọṅù, gi uwa; tiwanu nkpu ọṅù, unu ugwu: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ndi-Ya ewedara n'ala.


O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa.


Onye-nkpọrọ nke nēruda eruda emewo ngwa ka atọpu ya; ọ gaghi anwu kwa we rida n'olùlù, nri-ya agaghi-akọ kwa ukọ.


Jehova ab͕abawo ogwe-aka-Ya di nsọ ọtọ n'anya mba nile; nsọtu nile nke uwa we hu nzọputa nke Chineke-ayi.


Wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, sinu n'ebe ahu pua, unu emetula ihe ruru árú: sinu n'etiti ya pua: dinu ọcha, unu ndi nēbu ihe di iche iche nke Jehova.


Tiwanu nkpu ọṅù, tienu nkpu ọṅù n'ọtù, unu nkpọnkpọ ebe nke Jerusalem: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ b͕aputawo Jerusalem.


Le, Jehova emewo ka anuru ya rue nsọtu uwa, si, Sinu ada Zaion, Le, nzọputa-gi abiawo; le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n'aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n'iru Ya.


Na nkpab͕u nile ha Ya ka anākpab͕u, ọ bu kwa mọ-ozi nke iru-Ya zọputara ha: n'ihu-n'anya-Ya na n'ọmiko-Ya Ya onwe-ya b͕aputara ha; O we palie ha, kuru ha ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


Nurunu okwu Jehova, unu mba nile, gosi-kwa-nu ya n'agwe-etiti nile di n'ebe di anya; si-kwa-nu, Onye nēfesa Israel gāchikọta ya, debe kwa ya, dika onye-ọzùzù-aturu si emere ìgwè aturu-ya.


N'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, me ka ọ pua n'aka onye dikariri ya ike nwere onwe-ya.


Me ka ogidi di iche iche iri uzọ ama guzoro onwe-gi ọtọ, doro onwe-gi ide di iche iche iri uzọ ama: tukwasi obi-gi n'uzọ ahu atuliri atuli, bú uzọ nke i jere ije nime ya: lata, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú israel, lata n'obodo-gi ndia.


Gosinu n'etiti mba nile, menu ka anuru ya, bulienu ọkọlọtọ; menu ka anuru ya, unu ezobela: sinu, Ewerewo Babilon, emewo ka ihere mee Bel, Merodak atuwo ujọ; emewo ka ihere me arusi-ya nile akpuru akpu, arusi-ya nile atuwo ujọ.


Ge nti olu ndi nāb͕alaga, ndi nāb͕apu n'ala Babilon, igosi ibọ̀-ọ́bọ̀ nke Jehova, bú Chineke-ayi, na Zaion, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.


Sinu n'etiti Babilon wagharia, si-kwa-nu n'ala ndi Kaldea pua, di-kwa-nu ka nkpi n'iru ìgwè ewu na aturu.


Sinu n'etiti ya pua, unu ndim, wepuganu onwe-unu n'otù n'otù n'iwe di ọku nke Jehova.


Elu-igwe na uwa na ihe nile nke di nime ha ewe tie nkpu ọṅù bayere Babilon; n'ihi na ndi nāpunara ya ihe gēsi n'Ugwu biarue ya aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Sinu n'etiti Babilon b͕alaga, wepuga-kwa-nu onwe-unu n'otù n'otù; unu ekwela ka eme unu ka unu dere du n'ajọ omume-ya: n'ihi na mb͕e ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ọ buru Jehova; nmeso obodo ahu ka Ya onwe-ya nākwughachi ya.


M'gākpọkọta kwa ha òkù, chikọta ha; n'ihi na ab͕aputawom ha: ha gāba kwa uba otú ha baworo uba.


Tie nkpu ọṅù, ṅuria, gi ada Zaion: n'ihi na, le, Mu nābia, M'gēbi kwa n'etiti gi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ọ buru na onye nke gi enupuru enupu anọ na nsọtu elu-igwe, n'ebe ahu ka Jehova, bú Chineke-gi, gāchikọputa gi, n'ebe ahu ka Ọ gēweputa kwa gi.


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


M'we nu olu ọzọ ka o nēsi n'elu-igwe dà, si, Ndi nkem, sinu nime ya puta, ka unu we ghara iso ya nwekọ nmehie-ya nile, ghara kwa inata ufọdu nime ihe-otiti-ya nile:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan