Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 48:15 - Bible Nso

15 Mu onwem, ọbuná Mu onwem, ekwuwo okwu; e, akpọwom ya: emewom ka ọ bia, ọ gēme kwa ka ije-ya ga nke-ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya; e, akpọọla m ya. Aga m eme ka ọbịa nʼije ya, ọ ga-agakwa nke ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 48:15
8 Iomraidhean Croise  

N'ima-nma-gi nọkwasi n'elu inyinya ga nke-ọma, N'ihi ezi-okwu na ume-ala-n'obi na ezi omume: Aka-nri-gi gēzí kwa gi ihe di iche iche di egwu.


Ònye kpọteworo otù onye site n'ọwuwa-anyanwu, onye Ọ kpọrọ n'ezi-omume ibiarute ukwu-Ya? Ọ nēwere mba di iche iche nye n'iru ya, Ọ nēme kwa ya ka ọ nwe ike n'aru ndi-eze: O nēwere ha nye mma-agha-ya dika ájá, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke anēfepu efepu, otú a ka Ọ nēwere ha nye uta-ya.


Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Sairọs, si, Ọ bu onye-ọzùzù-aturum, ihe nile nke nātọm utọ ka ọ gēmezu kwa: ọbuná n'ikwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēwu ya; na n'isi ulo uku Chineke, Agātọ ntọ-ala-gi.


Mu onwem akpọtewo ya n'ezi omume, ọ bu kwa uzọ-ya nile ka M'gēme ka ha guzozie: onye ahu gēwu obodom, zilaga ndim emereri ka ha je biri n'ala ọzọ, ọ bughi n'ihi ọnu-ahia, ọ bughi kwa n'ihi iri-ngo, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Rigo megide ala Merataim, imegide ya, rigo kwa rue ndi bi na Pekod: b͕ue, wezuga kwa ka ebibie n'azu ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me kwa dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu.


N'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-ise nke emere ka Jehoiakim je biri n'ala ọzọ,


Akwukwọ iwu a agaghi-apu n'ọnu-gi, kama i gātughari uche nime ya ehihie na abali, ka i we lezie anya ime dika ihe nile si di nke edeworo nime ya: n'ihi na mb͕e ahu i gēme ka ije-gi ga nke-ọma, mb͕e ahu i gēnwe kwa uche.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan