Aịzaya 48:1 - Bible Nso1 Nurunu nka, unu ulo Jekob, ndi anākpọ n'aha Israel, ndi siwo-kwa-ra na miri Juda puta; ndi ji aha Jehova aṅu iyi, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha nēhota, ma ọ bughi n'ezi-okwu, ọ bughi kwa n'ezi omume. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a1 “Geenụ ntị na nke a, unu agbụrụ Jekọb, unu ndị a na-akpọ nʼaha Izrel, ndị si nʼagbụrụ Juda pụta. Unu ndị na-eji aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi, ndị na-akpọku aha Chineke nke Izrel, ma ọ bụghị nʼeziokwu maọbụ nʼezi omume. Faic an caibideil |
M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.