Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 47:3 - Bible Nso

3 Agēkpughe ọtọ-gi, e, agāhu ita-uta-gi: ọ́bọ̀ ka M'gābọ̀, M'gaghi-ezute madu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 A ga-ekpughe ọtọ gị, tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere. Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ, agaghị m elekwa anya nʼazụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 47:3
27 Iomraidhean Croise  

Ewe meghe anya ha abua, ha we mara na ndi b͕a ọto ka ha bu; ha we dukọta akwukwọ osisi fig, mere onwe-ha ihe-ọkiké.


otú a ka eze Asiria gēdulaga ndi Ijipt adọtara n'agha, na ndi Etiopia emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma umu ntà ma ndi-okenye, b͕ara ọtọ na ukwu efu, b͕a kwa ọtọ n'otule, ib͕aba Ijipt ọtọ.


n'ihi nka Onye-nwe-ayi gēme kwa ka ọnyá di n'opu-n'isi umu-ndinyom Zaion, Jehova ga-agbaba kwa ha ọtọ.


Sinu ndi obi-ha nēme ngwa, Dinu ike, unu atula egwu: le, Chineke-unu! ibọ̀-ọ́bọ̀ nābia, bú nkwughachi nke Chineke; Ya onwe-ya gābia zọputa unu.


Ma mb͕e i gāsi n'obi-gi, Gini mere ihe ndia ji dakwasim? n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi ka eji kpughe ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi, me ikiri-ukwu-gi abua ihe-ike.


Ya mere Mu onwem ji kpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi rue iru-gi, ewe hu nlelì-gi.


Muchanu àkú nile; jidesienu ọta nile ike: Jehova akpọtewo mọ nke ndi-eze Midia; n'ihi na imegide Babilon ka nzube-Ya di, ibibi ya: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.


Ha gāda kwa, buru ndi eb͕uru eb͕u, n'ala ndi Kaldea, na ndi adupuru adupú, n'èzí-ya nile.


n'ihi na onye nāpunara ya ihe-ya ab͕iakwasiwo obodo ahu, bú Babilon, ejidewo kwa ndi-dike-ya, ab͕ajisiwo uta nile ha: n'ihi na Chineke nke nēmeso madu otú ha si eme ka Jehova bu, Ọ ghaghi ikwughachi.


n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta ndi nile nāhu gi n'anya, ndi ihe-gi nātọ ha utọ, na ndi nile i huworo n'anya, ha na ndi nile i kpọworo asì; ọ bu na M'gāchikọta ha imegide gi buruburu, M'gēkpughe-kwa-ra ha ọtọ-gi, ka ha we hu ọtọ-gi nile.


Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēkpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi n'iru-gi, me ka mba nile hu ọtọ-gi, na ala-eze nile ka ha hu ihere-gi.


Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru.


Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi, Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu: N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso, Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.


Ewe kewa obodo uku ahu uzọ atọ, obodo nile nke mba nile we da: ewe cheta Babilon uku ahu n'iru Chineke, inye ya iko nke manya nke ọnuma nke iwe-Ya.


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan