Aịzaya 47:1 - Bible Nso1 Rida, we nọdu n'ájá, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Babilon; nọdu n'ala ghara inwe oche-eze, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gaghi-abu kwa onye ha nākpọ nwanyi di nrò nke di kwa pekepeke. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a1 “Rịda nʼala, nọdụ na uzuzu, gị nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Babilọn, nọdụ nʼala na-ejighị ocheeze, gị eze nwanyị obodo ndị Babilọn. Agaghị akpọkwa gị onye dị nro, maọbụ onye dị pekepeke. Faic an caibideil |