Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 46:4 - Bible Nso

4 ọzọ, rue agadi Mu onwem bu Onye ahu, ru kwa isi-awọ Mu onwem gēku unu n'aka: Mu onwem emewo, Mu onwem gēbu kwa; e, Mu onwem gēku n'aka me kwa ka unu wepuga onwe-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya, ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu. Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu. Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 46:4
17 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Nka bu Chineke, bú Chineke-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi; Ya onwe-ya ganēdu ayi rue n'inwu-ọnwu.


Onye agọziri agọzi ka Onye-nwe-ayi bu, kwa-ubọchi ka Ọ nēburu ayi ibu, Bú Chineke Nke bu nzọputa-ayi. Selah


Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke; Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.


Etufulam na mb͕e agadi; Mb͕e ikem gwusiri arapulam.


Ha gānọ nāmi nkpuru n'isi-awọ; Osisi nke miri di ha n'aru ri nne, nke nwezu-kwa-ra akwukwọ ndu, ka ha gābu.


ònye luworo ya, me ya, nākpọ ọb͕ọ nile site na mb͕e mbu? Ọ bu Mu onwem, bú Jehova, Onye mbu, Nke nọye-kwa-ra ndi ikpe-azu, Mu onwem bu Onye ahu.


Ọzọ, site n'ubọchi ta Mu onwem bu Ya; ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam: anamalu ọlu, ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu?


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n'ihi Mu onwem; M'gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile.


Gem nti, Jekob, na Israel, bú onye M'kpọworo: Mu onwem bu Onye ahu; Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu.


N'ihi na Ọ kpọwo nchupu-nwunye asì, otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, ya na onye ji ihe-ike ekpuchi uwe-ya, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: n'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka unu we ghara ighọḅu.


N'ihi na Mu onwem, bú Jehova, aḅanweghi; ya bu na emeghi ka unu onwe-unu gwusia, umu Jekob.


N'ihi na nchèghari adighi n'onyinye-amara nile na ọkpukpọ nke Chineke.


na n'ọzara, ebe i huworo na Jehova, bú Chineke-gi, kuru gi, dika nwoke si eku nwa-ya nwoke, n'uzọ ahu nile nke unu jere, rue mb͕e unu biaruru ebe a.


Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāpiakọta kwa ha, Dika uwe, agāb͕anwe kwa ha: Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile, Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu.


Jisus Kraist di otù aka ahu nnyahu na ta, ma rukwa mb͕e nile ebighi-ebi.


Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n'elu bia, ebe o si n'aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpughi idi n'ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan