Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 45:3 - Bible Nso

3 M'gēnye kwa gi àkù nke ọchichiri, na àkù zoro ezo nke ebe nzuzo di iche iche, ka i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye ahu Nke nākpọ gi n'aha-gi, ọbuná Chineke Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara, akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche. Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 45:3
15 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid.


Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m'buru onye-nlekọta n'iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda.


Moses we si Jehova, Le, Gi onwe-gi nāsim, Me ka ndi nka rigota: ma Gi onwe-gi emeghi ka M'mara onye I gēziga ka mu na ya yikọ je. Ma Gi onwe-gi asiwo, Amawom i n'aha, ọzọ kwa, i hutawo amara n'irum.


Jehova we si Moses, Ihe a nke i kwuworo, M'gēme kwa ya: n'ihi na i hutawo amara n'irum, amawokwam i n'aha.


Gosinu ihe ahu nile gābia n'ọdi-n'iru, ka ayi we mara na chi ka unu bu: e, menu ezi ihe, ma-ọbu menu ihe ọjọ, ka ayi we lerita onwe-ayi anya gburugburu n'ujọ, hu ya n'otù.


Ma ub͕u a, otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Jekob, Nke kpuwo-kwa-ra gi, Israel: Atula egwu, n'ihi na ab͕aputawom i; akpọwom i n'aha-gi, nkem ka i bu.


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, ekwuwo okwu; e, akpọwom ya: emewom ka ọ bia, ọ gēme kwa ka ije-ya ga nke-ọma.


Genum nti, unu agwe-etiti; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi di iche iche, site n'ebe di anya: Jehova esitewo na mb͕e m'nọ n'afọ kpọm; site na mb͕e m'nọ n'afọ nnem ka O hotaworo aham:


Ma achọtara ndikom iri n'etiti ha ndi siri Ishmael, Emela ka ayi nwua: n'ihi na ayi nwere àkù zoro ezo n'ọhia, bú ọka wheat, na ọka barley, na manu, na manu-aṅu. O we rapu, ghara ime ka ha nwua n'etiti umu-nne-ha.


Sinu na nsọtu-ya biarue ya, meghenu ọba-ya nile: tulienu ya dika obo-ihe, wezuga-kwa-nu ya ka ebibie ya: ekwela ka ihe fọduru ya.


Mma-agha di n'ebe inyinya-ya nile di, na n'ebe ub͕ọ-ala-ya di, na n'ebe ndi nile gwara ọgwa nọ, bú ndi nọ n'etiti ya, ha gāghọ kwa ndinyom: mma-agha di n'ebe àkù-ya nile di, agāluta kwa ha n'agha.


Gi onye bi n'elu ọtutu miri, onye nwere ọtutu àkù, ọgwugwu-gi abiawo, bú ọtùtù nke urù-gi nēzighi ezi.


Asi na Babilon arigorue elu-igwe, asi kwa na o wusie ebe di elu nke ike-ya ike, ma na Mu ka ndi nāpunara ya ihe gēsi biarue ya aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan