Aịzaya 44:3 - Bible Nso3 N'ihi na M'gāwukwasi miri n'aru onye akpiri nākpọ nku, na ọtutu miri-iyi n'ala-akọrọ: M'gāwukwasi Mọm n'aru nkpuru-gi, na ngọzim n'aru umu i muru: Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a3 Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri, mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ. Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m, meekwa ka ngọzị m dịrị ha. Faic an caibideil |
M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.