Aịzaya 44:27 - Bible Nso27 Onye ahu Nke nāsi ob͕u-miri, Takọ; osimiri-gi nile ka M'gēme kwa ka ha tachasia: Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a27 Onye ahụ na-asị, ogbu mmiri, ‘Takọrọ, aga m emekwa ka iyi ya niile takọrọsịa,’ Faic an caibideil |
Gini mere onye ọ bula adighi mb͕e M'biara? gini mere onye-ọziza adighi mb͕e M'kpọrọ òkù? ọ̀ bu na akam dikara nkpunkpu ma-ọli ib͕aputa? ma-ọbu ọ̀ dighi ike di nimem inaputa? Le, n'ibasi-nba-ikem anameme ka oké osimiri tasia, anameme osimiri ka ha ghọ ọzara: azù-ha nēsì ísì, n'ihi na miri adighi, we nwua n'akpiri-ikpọ-nku.