Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 44:23 - Bible Nso

23 Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe, n'ihi na Jehova emewo ya; tienu nkpu, unu ebe nile di ala nke uwa; unu ugwu, tibenu nkpu ọṅù, gi oké ọhia, na osisi ọ bula di nime ya: n'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, ọ bu kwa n'Israel ka Ọ gēme Onwe-ya ka Ọ ma nma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Bụọnụ abụ oke ọṅụ, unu eluigwe, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ya; tienụ oke mkpu, unu ụwa dị nʼala. Tienụ mkpu ọṅụ, unu ugwu niile, unu bụ oke ọhịa niile na osisi ọbụla nke dị nʼime gị, nʼihi na Onyenwe anyị agbapụtala Jekọb, na-egosikwa ebube ya nʼIzrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 44:23
40 Iomraidhean Croise  

Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù; Ka ha si kwa n'etiti mba nile, Jehova bu eze.


Ka oké osimiri bib͕ọ, ya na ùjú-ya; Ka obi tọ ọhia utọ, ya na ihe nile nke di nime ya;


Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù n'iru Jehova, N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe.


Tonu Jehova site n'uwa, Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile:


Ugwu nile na ugwu ntà nile; Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile:


Ewerewo igwè ewu na aturu yikwasi ebe-ita-nri nile dika uwe; Anēwere ọka kpuchie ndagwurugwu nile; Ha nēti nkpu ọǹù, e, ha nābù abù.


Ka elu-igwe na ala to Ya, Ha na oké osimiri, na ihe ọ bula nke nākpughari nime ha.


N'ihi na Chineke gāzọputa Zaion, wu kwa obodo nile nke Juda; Madu gēbi kwa n'ebe ahu, we nweta ya.


Gi nwere ogwe-aka nke idi-ike di nime ya: Aka-Gi di ike, aka-nri-Gi di elu.


Jetro we ṅuria ọṅu bayere ezi ihe nile nke Jehova mere Israel, ndi ọ naputara n'aka ndi Ijipt.


Bùkuenu Jehova abù ọma; n'ihi na ihe-ọkaka ka O meworo: emewo ka amara nka n'uwa nile.


I tukwasiwo madu na mba nka, Jehova, I tukwasiwo madu na mba nka; I natawo nsọpuru: I mewo ka nsọtu nile nke ala di anya.


Ma ub͕u a, otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Jekob, Nke kpuwo-kwa-ra gi, Israel: Atula egwu, n'ihi na ab͕aputawom i; akpọwom i n'aha-gi, nkem ka i bu.


onye ọ bula nke anākpọ n'aham, nke M'kèwo-kwa-ra nye nsọpurum; akpuwom ya; e, emewom ya.


Ewetawom ezi omumem nso, ọ gaghi-adi n'ebe di anya, nzọputam agaghi-anọ kwa ọdù; M'we nye nzọputa nime Zaion, nye kwa Israel ima-nmam.


Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe; tegharia egwú ọṅù, gi uwa; tiwanu nkpu ọṅù, unu ugwu: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ndi-Ya ewedara n'ala.


O we sim, Orùm ka i bu; gi Israel, onye ọ bu nime gi ka M'gēme Onwem ka M'ma nma.


Tiwanu nkpu ọṅù, tienu nkpu ọṅù n'ọtù, unu nkpọnkpọ ebe nke Jerusalem: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ b͕aputawo Jerusalem.


Ndi-gi kwa, ha nile gābu ndi ezi omume, rue mb͕e ebighi-ebi ka ha gēnweta ala; alaka nke ọkukúm, ọlu akam, ime ka M'ma nma.


idoro ndi Zaion nēru újú, inye ha ihe ọma ike n'isi n'ọnọdu ntu, manu obi-utọ n'ọnọdu iru-újú, ákwà-nb͕okwasi otuto n'ọnọdu mọ nke inyoghi-inyoghi; ka enwe kpọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe-ọkukú nke Jehova, ime ka ọ ma nma.


N'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, me ka ọ pua n'aka onye dikariri ya ike nwere onwe-ya.


Elu-igwe na uwa na ihe nile nke di nime ha ewe tie nkpu ọṅù bayere Babilon; n'ihi na ndi nāpunara ya ihe gēsi n'Ugwu biarue ya aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: ka ọṅù nke uwa nka nile ra, otú a ka M'gēme gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buere ugwu nile nke Israel amuma, si, Unu ugwu Israel, nurunu okwu Jehova.


Ma unu onwe-unu, ugwu Israel, ngalaba-unu ka unu gāwaputa, miara ndim, bú Israel, nkpuru-unu; n'ihi na ha nọ nso ibia.


E, ndi nile nke ala ahu gēli ha; ọ gāghọ-kwa-ra ha aha, n'ubọchi agāsọpurum; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


otuto diri Ya nime nzukọ-Ya na nime Kraist Jisus rue ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


(Ma okwu nka, Ọ rigoro, gini ka ọ bu ma-ọbughi na Ọ rida-kwa-ra nime akuku uwa dikariri ala?


ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


N'ihi nka, ka obi nātọ unu utọ, unu elu-igwe nile, na unu ndi bi nime ha. Ahuhu gādiri uwa na oké osimiri: n'ihi na ekwensu aridakuruwo unu, nēnwe oké ọnuma, ebe ọ matara na o nwere nání nwa oge.


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan