Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 44:17 - Bible Nso

17 ma nke fọduru nime ya ka o meworo ka ọ ghọ chi, ọbuná arusi ya-akiri-api: ọ nāda kpu iru n'ala n'iru ya, nākpọ kwa isi ala, nēkpere ya, si Naputam; n'ihi na chim ka i bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị; Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe. Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị, “Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 44:17
19 Iomraidhean Croise  

Ha we were oke-ehi nke enyere ha, ha we dozie ya, kpọkue aha Beal site n'ututu we rue etiti-ehihie, si, Beal, za ayi. Ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza. Ha we wukwasi n'elu ebe-ichu-àjà nke emere.


Ha we were oké olu kpọ, were mma-agha na ube bìe aru onwe-ha dika ha si eme, rue mb͕e ọbara wukwasiri ha.


Ala-ha juputa-kwa-ra n'ihe-efu; ọlu nke aka-ha ka ha nākpọ isi ala nye, bú ihe nke nkpisi-aka-ha mere.


O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n'ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n'ala Ararat. Isa-hadon, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.


Ọ gābu-kwa-ra madu ihe isure ọku; o we were ufọdu nime ha, nya ọku; e, ọ funwue ya, we sie achicha: e, ọ nāpi chi, we kpọ isi ala nye ya; o mewo ya arusi apiri api, we da kpue iru n'ala n'iru ya.


Nkera-ya ka o sureworo n'ọku; o ji nkera-ya eri anu; ọ nāru anu-ọruru, we rijue afọ: e, ọ nānya ọku we si, Ehe, aru ekpowom ọku, ahuwom ọku:


Chikọtanu onwe-unu, bia; biarunu nso n'otù, unu ndi mba nile b͕aputara ab͕aputa: ha amaghi ama, bú ndi ahu nēbu osisi arusi-ha apiri api, ndi nēkpe-kwa-ra chi nādighi-azọputa.


Ndi ahu ndi nāwufu ọla-edo n'akpa, ndi nātù kwa ọla-ọcha n'ihe-ọtùtù, ha nēgota onye-nnucha-ọla, o we me ya ka ọ buru chi: ha nāda kpu iru n'ala, e, ha nākpọ isi ala.


ndi nāsi osisi, Nnam ka i bu; nāsi kwa nkume, Gi onwe-gi murum: n'ihi na ha ab͕akutawom azu, ha echeghm iru: ma na mb͕e ọnọdu ọjọ ha ha gasi, Bilie, we zọputa ayi.


Asi na ọ di uzọ ọ bula Chineke ahu Onye ayi onwe-ayi nēfè puru inaputa ayi, ọ bu n'oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu na n'aka-gi, eze, ka Ọ gānaputa ayi.


N'ihi ya anēsite n'akam nye iwu, si, na ndi ọ bula, ma-ọbu mba ọ bula, ma-ọbu asusu ọ bula, nke gēkwuhie megide Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego, agābọkasi ya, ọ bu kwa ulo-ya ka agēme ebe-ikpofu-ahihia: n'ihi na ọ dighi chi ọzọ nke puru inaputa otú a.


Mb͕e ahu eze kwuru, ha we me ka Daniel bia, ha we tubà ya n'olùlù ọdum. Eze zara, si Daniel, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ya onwe-ya gādọputa gi.


Ọ bu Onye-ndọputa, na Onye-nnaputa, na Onye nēme ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-iju-anya di iche iche n'elu-igwe na n'uwa; Onye dọputaworo Daniel n'aka ọdum.


Ma ub͕u a ha nēmehie kari, we mere onwe-ha arusi apiri api site n'ọla-ọcha-ha, bú arusi di iche iche dika nghọta-ha si di, ọlu nke ndi-ọ̀kà ka ha nile bu: ọ bu bayere ihe ndia ka ha onwe-ha nēkwu okwu, si, Ka ndi nāchu àjà madu sutue umu-ehi ọnu.


M'gēbipu kwa n'aka-gi mb͕asi nile; i gaghi-enwe kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ:


Ahuhu diri onye nāsi osisi, Teta; nke nāsi nkume dara ob͕i, Kpọte onwe-gi! Nka, ò gēzí ihe? Le, ihe a bu ihe eji ọla-edo na ọla-ọcha machita, ọ dighi kwa mọ ọ bula di nime ya.


ọ bughi kwa nání na ihe-ize-ndu di na agēlelì ọlu-ayi nka; kama na agāgu kwa ulo nke oké chi-nwanyi ahu, bú Daiana, n'ihe-efu, na agaje kwa isi n'idi-uku-ya weda ya n'ala, onye Esia dum na elu-uwa dum madu bi nāsọpuru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan