Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 44:15 - Bible Nso

15 Ọ gābu-kwa-ra madu ihe isure ọku; o we were ufọdu nime ha, nya ọku; e, ọ funwue ya, we sie achicha: e, ọ nāpi chi, we kpọ isi ala nye ya; o mewo ya arusi apiri api, we da kpue iru n'ala n'iru ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere; ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ, ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha. Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya; ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 44:15
10 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Amazaia latara site na ntib͕u ndi Edom, na ọ chibatara chi nke umu Sia, guzoro ha onwe-ya ibu chi, we kpọ isi ala n'iru ha, surere ha ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ.


Ala-ha juputa-kwa-ra n'ihe-efu; ọlu nke aka-ha ka ha nākpọ isi ala nye, bú ihe nke nkpisi-aka-ha mere.


Ònye kpuworo chi, ma-ọbu wua arusi apiri api nke nābaghi urù ma-ọli?


Ọ nēb͕uturu onwe-ya osisi cedar di iche iche, were kwa osisi holm na osisi oak, ọ nēme-kwa-ra onwe-ya otù osisi nētiti osisi nile nke oké ọhia ka o nwe ume: ọ kuwo osisi fir, miri-ozuzo nēme kwa ka o bùe ibù.


Nkera-ya ka o sureworo n'ọku; o ji nkera-ya eri anu; ọ nāru anu-ọruru, we rijue afọ: e, ọ nānya ọku we si, Ehe, aru ekpowom ọku, ahuwom ọku:


ma nke fọduru nime ya ka o meworo ka ọ ghọ chi, ọbuná arusi ya-akiri-api: ọ nāda kpu iru n'ala n'iru ya, nākpọ kwa isi ala, nēkpere ya, si Naputam; n'ihi na chim ka i bu.


Chikọtanu onwe-unu, bia; biarunu nso n'otù, unu ndi mba nile b͕aputara ab͕aputa: ha amaghi ama, bú ndi ahu nēbu osisi arusi-ha apiri api, ndi nēkpe-kwa-ra chi nādighi-azọputa.


Ndi ahu ndi nāwufu ọla-edo n'akpa, ndi nātù kwa ọla-ọcha n'ihe-ọtùtù, ha nēgota onye-nnucha-ọla, o we me ya ka ọ buru chi: ha nāda kpu iru n'ala, e, ha nākpọ isi ala.


Ma ndi fọduru n'etiti madu, ndi anēb͕ughi n'ihe-otiti ndia, echègharighi isi n'ọlu nile nke aka-ha puta, ka ha we ghara ikpọ isi ala nye ndi-mọ ọjọ, ha na arusi-ha nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke nkume, na nke osisi; nke nāpughi ile ihe anya, ma-ọbu inu ihe, ma-ọbu ije ije:


O rue, n'ọnwu onye-ikpe ahu, na ha laghachiri, we bibie onwe-ha kari ndi bu nna-ha, n'ijeso chi ọzọ ifè ha òfùfè, na ikpọ isi ala nye ha; ha ekweghi ka ihe si n'omume nile ha, ma-ọbu n'uzọ-ha siri ike, dapu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan