M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'etiti Mu na gi na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gāburu gi, buru kwa nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, Chineke.
N'ihi na Jehova gēnwe obi-ebere n'aru Jekob, Ọ gārọputa kwa Israel ọzọ, do ha n'ala-ha: ọbìa gārapara kwa n'aru ha, ha gēme kwa onwe-ha ka ha na ulo Jekob dikọ n'otù.
Ma ub͕u a, otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Jekob, Nke kpuwo-kwa-ra gi, Israel: Atula egwu, n'ihi na ab͕aputawom i; akpọwom i n'aha-gi, nkem ka i bu.
Tọnu nti-unu n'ala, biakutem; nurunu, nkpuru-obi-unu ewe di ndu: Mu na unu gāb͕a kwa ndu, bú ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, bú ebere nile kwesiri ntukwasi-obi nke emere Devid.
Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n'ihi na, le, M'gaje izọputa gi n'ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n'ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n'aru bū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.
Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.
Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nnekwu-ọkuku nāchikọ umu nke aka ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!