Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 43:23 - Bible Nso

23 I kpughi aturu nke àjà-nsure-ọku-gi nile biakutem; i jighi kwa àjà-gi nile sọpurum. Ejighm onyinye-inata-iru-ọma me ka i fè òfùfè, ejighkwam frankincense me ka ike gwu gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ, maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m. O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka, maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 43:23
19 Iomraidhean Croise  

M'we mata na enyeghi òkè ndi Livai enye; ndi Livai na ndi-ọbù-abù, bú ndi nēje ozi ahu, we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ubi-ya.


Jehova we si Moses, Chiri n'onwe-gi uda utọ di iche iche, stacte, na onycha, na galbanum; bú uda utọ, ha na frankincense anāgwaghi agwa: ha gāra n'ọtùtù;


Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.


Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú: O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya?


Sọpuru Jehova site n'àkù-gi, Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile:


Onye nēb͕u ehi di ka onye nētib͕u madu; onye ji nwa-aturu achu àjà di ka onye nāb͕aji olu nkita; onye nēsure àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma, di ka onye nēsure ọbara ezì; onye nēsure frankincense ka ọ buru ihe-ncheta di ka onye nāgọzi ajọ ihe: e, ndi ahu arọputawo uzọ nile nke aka ha, ọ bu kwa ihe-árú nile ha nātọ nkpuru-obi-ha utọ;


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Tukwasinu àjà-nsure-ọku nile unu n'elu àjà nile unu, ri-kwa-nu anu.


N'ihi na agwaghm nna-unu-hà okwu, enyeghkwam ha iwu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta, bayere ihe nile nke àjà-nsure-ọku na nke àjà ọzọ:


Ma mb͕e madu gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú onyinye anēnye Jehova inata iru-ọma, utu ọka flour ka onyinye-ya iji biaru nso gābu; ọ gāwukwasi ya manu, tiye kwa frankincense n'elu ya:


I gētiye kwa frankincense anāgwaghi agwa n'elu usoro ọ bula, ka ọ we ghọrọ achicha ahu ihe-ncheta, bú àjà-ọku anāchuru Jehova.


Ọ̀ di àjà di iche iche na onyinye-inata-iru-ọma unu wetaram n'ọzara ọgu arọ abua, unu ulo Israel?


Ndim, gini ka M'meworo gi? ọ̀ bu kwa gini ka M'jiworo me ka ike gwu gi? b͕a àmà megidem.


Madu, ọ̀ gāpunara Chineke ihe? ma unu nāpunaram ihe. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi punaraworo Gi ihe? N'otù uzọ n'uzọ iri nile na àjà-nbuli nile.


N'ihi na yoke nkem adighi-eb͕u nb͕u, ibum di kwa nfé.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan