Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 42:16 - Bible Nso

16 M'ga-eme kwa ka ndi-ìsì je ije n'uzọ ha nāmaghi; n'okporo-uzọ ha nāmaghi ka M'gēme ka ọchichiri buru ìhè n'iru ha, me kwa ebe b͕agọrọ ab͕agọ ka ha guzozie. Ihe ndia ka M'gēme, M'gaghi-arapu kwa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Aga m edu ndị kpuru ìsì, site nʼụzọ nke ha na-amaghị, nʼokporoụzọ ha agatụbeghị ka m ga-edu ha; Aga m eme ka ọchịchịrị ghọọ ìhè nʼihu ha, meekwa ka ebe niile gbagọrọ agbagọ guzozie. Ihe ndị a niile ka m ga-eme. Agaghị m agbakụta ha azụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 42:16
40 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka, Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya.


Ihe nke b͕agọrọ ab͕agọ, apughi ime ka ọ dizie: ọzọ, ihe-nkọnari, apughi iguta ya.


Le ọlu Chineke: n'ihi na ònye puru ime ka ọ dizie, bú ihe O meworo ka ọ b͕agọ?


Uzọ onye ezi omume nēso bu izi-ezi nile: Gi onye ziri ezi nēme ka uzọ onye ezi omume di lari.


Ndi nti chiri gānu kwa okwu nile nke akwukwọ n'ubọchi ahu, ọ bu kwa n'oké ọchichiri na n'ọchichiri ka anya ndi-ìsì gēsi hu uzọ.


Ndi nākpafu na mọ-ha gāma kwa nghọta, ndi-ntamu gāmuta kwa ihe-nmuta.


Ọ bu kwa n'ihi nka ka Jehova gēchere, imere unu amara, ọ bu kwa n'ihi nka ka agēbuli Ya, inwe obi-ebere n'aru unu: n'ihi na Chineke nke ikpé ka Jehova bu; ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nile ndi nēchere Ya bu.


nti-gi abua gānu kwa okwu n'azu-gi, si, Nka bu uzọ, jenu ije nime ya; mb͕e unu nēche iru n'aka-nri, na mb͕e unu nēche iru n'aka-ekpe.


Agaghi-etechi kwa anya nke ndi nāhu uzọ, nti nke ndi nānu ihe gāṅa kwa nti.


Mb͕e ahu ka agēmeghe anya ndi-ìsì, ọ bu kwa nti nke ndi nti chiri ka agēmeghe.


Uzọ atuliri atuli, ọbuná uzọ, gādi kwa n'ebe ahu, Uzọ nke idi-nsọ ka agākpọ kwa ya; onye ruru árú agaghi-agabiga na ya; ma uzọ ahu gādiri ndi ahu: onye ọ bula nke nāga n'uzọ, ọbuná ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ha agaghi-akpafu akpafu.


Agēme ndagwurugwu ọ bula ka ọ di elu, agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala: ebe di nkputankpu gāghọ kwa, ebe guzoziri eguzozi, nkume nile di elu gāghọ kwa ebe di lari:


Ndi ewedara n'ala na umu-ob͕eye nāchọ miri ma ọ dighi nke dinu, ire-ha kpọsiri nku n'ihi akpiri kpọrọ nku; Mu onwem, bú Jehova, gāza ha, Mu, bú Chineke Israel, M'gaghi-arapu ha.


Ọ nāchu ha, gabiga n'udo; o jighi ukwu-ya abà n'uzọ.


Mu onwem gāga n'iru-gi, me ka nkputankpu ebe nile guzozie: ibo-ọnu-uzọ ọla nile ka M'gētiwa, ihe-ntuchi ígwè nile ka M'gēb͕ujipu kwa:


Abum Onye nākpu ìhè na Onye nēkè ọchichiri; abum Onye nēme udo na Onye nēkè ihe ọjọ: Mu onwem bu Jehova, Onye nēme ihe ndia nile.


Otú a ka Jehova siri, bú Onye-nb͕aputa-gi na Onye Nsọ Israel: Mu onwem bu Jehova, Chineke-gi, Onye nēzí gi ime ihe nābà úrù, Onye nēme ka i zọ ije n'uzọ i gējeso.


N'ihi na ọ bughi na ngwa ka unu gāpu, ọ bughi kwa na nb͕alaga ka unu gēje: n'ihi na Onye nāga n'iru unu bu Jehova; ọzọ, Onye nāga n'azu unu bu Chineke Israel.


Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba.


ọ buru kwa na i weputara onye agu nāgu ihe nkpuru-obi-gi chọrọ, ọ buru na i me ka afọ ju nkpuru-obi ewedara n'ala; ìhè-gi gāwa nime ọchichiri, oké ọchichiri-gi gādi kwa ka etiti-ehihie:


Ha gākpọkwa ha Ndi nsọ ahu, Ndi Jehova b͕aputaworo: agākpọ kwa gi Obodo achọputara achọputa, Obodo anārapughi arapu.


Ha gākasi kwa unu obi, mb͕e unu nāhu uzọ-ha na omume nile ha: unu ewe mara na ọ bughi n'efu ka M'meworo ihe ahu nile nke M'meworo nime ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


N'ihi nka, le, Mu onwem gaje iràra ya, me ka ọ je n'ọzara, M'gāgwa kwa ya okwu nke gābà ya n'obi.


N'ihi nka, le, M'gaje iji ogwu b͕achi uzọ-gi, M'gāb͕achibido kwa ya ogige, o we ghara ichọputa okporo-uzọ-ya nile.


chọnu Onye nēme Pleiades na Orion, Nke nāb͕anwe onyinyo ọnwu ka ọ ghọ ututu, Nke nēme kwa ka ehihie b͕a ọchichiri dika abali; Onye ahu Nke nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha ala; Jehova bu aha-Ya;


Agēkpoju ndagwurugwu ọ bula, Agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala; Ebe di nb͕agọ gāghọ kwa ebe guzoziri eguzozi, Ebe nile di nkputankpu gābu kwa uzọ di lari;


isaghe anya-ha, ka ha we si n'ọchichiri chigharia ba n'ìhè, si kwa n'ike Setan chigharikute Chineke, ka ha we nara nb͕aghara nmehie nile na ihe-nketa n'etiti ndi edoworo nsọ site n'ikwere na Mu.


n'ihi na unu buri ọchichiri n'oge gara aga, ma unu bu ìhè ub͕u a nime Onye-nwe-ayi: nējegharinu dika umu nke ìhè


Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.


Nání, ókè gādi n'etiti unu na ya, dika nnù cubit ise n'ọtùtù: unu abiarula nso ya, ka unu we mara uzọ nke unu gēsi je; n'ihi na unu agabigaghi n'uzọ a na mb͕e gara aga.


Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan