Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 42:11 - Bible Nso

11 Ka ọzara na obodo-ya nile welie olu-ha, obodo ntà nile Kida bi: ka ndi bi na Sela tie nkpu ọṅù, ka ha si n'elu ugwu nile tisie nkpu ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu, ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ. Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ, ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 42:11
21 Iomraidhean Croise  

Jehova we si ya, Mba abua di n'afọ-gi, Agēkewa kwa mba abua site n'úkwù-gi; Otù mba gēnwe ume kari mba ibe-ya; Nke-okenye gēfè nke-ntà.


Ahuhu dirim, na anọm dika ọbìa nime Meshek, Na ebim n'akuku ulo-ikwū nile nke Kida!


Bùkuenu Jehova abù ọma; n'ihi na ihe-ọkaka ka O meworo: emewo ka amara nka n'uwa nile.


Sinu na Sela n'uzọ ọzara zigara onye nāchi ala umu-aturu, rue ugwu ada Zaion.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Tutu otù arọ agwu, dika arọ onye egoro ọlu si di, nsọpuru nile nke Kida gāgwusi:


Mb͕e ahu ikpé ziri ezi gēnwe ebe-obibi-ya n'ọzara, ezi omume gēbi kwa n'ubi ọma ahu.


Obi gātọ ọzara na ala kpọrọ nku utọ; ala ihe nādighi gēteghari kwa egwú ọṅù, b͕awa okoko-ọhia, dika rose.


Mb͕e ahu ka onye-ngwurọ gāmali dika ele, ire onye-ob͕i gēti kwa nkpu ọṅù: n'ihi na n'ọzara ka miri nāb͕awaputa, miri-iyi kwa n'ala ihe nādighi.


Ọ bu olu nke onye nākpọ nkpu n'ọzara, si, Dozienu uzọ Jehova, menu ka uzọ atuliri atuli guzoziere Chineke-ayi n'ala ihe nādighi.


Le, anameme ihe ọhu; ub͕u a ka ọ gēpú; ùnu agaghi-ama ya? e, M'gēme ka uzọ di n'ọzara, me kwa ka osimiri di iche iche di n'ala tọb͕ọrọ n'efu.


Le, ka ha si ma nma nke-uku n'elu ugwu, bú ukwu nke onye nēzisa ozi ọma, bú onye nēme ka anuru okwu udo, onye nēzisa ozi ọma nke ezi ihe, onye nēme ka anuru okwu nzọputa; onye nāsi Zaion, Chineke-gi bu eze!


Ìgwè ewu na aturu nile nke Kida ka agāchikọtara gi, ebulu nile nke Nebaiot gējere gi ozi: ha gārigota n'ebe-ichu-àjàm dika ihe nātọ utọ, M'gēme kwa ulo nke ima-nmam ka ọ ma nma.


Le, Mu nēmegide gi, gi nwayi bi na ndagwurugwu, gi oké nkume nke ebe di lari, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); unu ndi nāsi, Ònye gāridata imegide ayi? ma-ọbu ònye gābata n'ebe-obibi nile ayi?


Rapunu obodo nile, we biri na nkume di elu, unu ndi bi na Moab; di-kwa-nu ka nduru nke nālu akwu-ya n'ofè ọnu olùlù.


Idi-egwu-gi, nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume ahu di elu, onye nējide ebe di elu nke ugwu ntà: n'ihi na asi na i me akwu-gi ka ọ di elu dika nke ugo, M'gēme ka i si n'ebe ahu ridata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Bilienu, rigorue mba nke nọ n'udo, nke bi na ntukwasi-obi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); nke nēnweghi ọnu-uzọ ma-ọbu ihe-ntuchi, nání ha nēbi.


Arebia na ndi-isi nile nke Kida, ndi ahu bu ndi-ahia nke aka-gi; n'umu-aturu na ebulu na ewu, n'ihe ndia ka ha bu ndi-ahia-gi.


Nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume di elu, ebe di elu ka ebe-obibi-ya bu; onye nāsi n'obi-ya, Ònye gēme ka m'ridarue ala?


Le, n'elu ugwu ka ukwu nke onye n'ezisa ozi ọma di, bú onye nēme ka anuru okwu udo! Me ememe-gi nile, gi Juda, Kwughachi nkwa nile i kwere: n'ihi na onye jọb͕uru onwe-ya agaghi-agabiga kwa nime gi ọzọ; ebipusiwo ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan