Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 41:25 - Bible Nso

25 Akpọtewom otù onye site n'Ugwu, o we bia, otù onye site n'ọwuwa-anyanwu nke gākpọku aham: ọ gābiakwasi kwa ndi nọchiri anya eze dika agāsi na ha bu urọ, na dika ọkpu-ite si azọ ájá.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 “Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa. Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ. Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ, ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 41:25
15 Iomraidhean Croise  

Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala, Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha.


Imegide mba emeruru emeru ka M'nēziga ya, bayere ndi nke nrubiga-ókè-iwem ka M'nēnye kwa ya iwu, ikwata ihe-nkwata n'agha, na iluta ihe-nluta n'agha, na ido ha ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.


Ọhù siri ike ka egosiworom; onye-nghọb͕u nāghọb͕u, onye nāpunara madu ihe nāpunara madu ihe. Rigo, gi Ilam; nọchigide n'agha, gi Midia; ize-ume-ya nile ka M'meworo ka ọ kwusi.


Ònye kpọteworo otù onye site n'ọwuwa-anyanwu, onye Ọ kpọrọ n'ezi-omume ibiarute ukwu-Ya? Ọ nēwere mba di iche iche nye n'iru ya, Ọ nēme kwa ya ka ọ nwe ike n'aru ndi-eze: O nēwere ha nye mma-agha-ya dika ájá, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke anēfepu efepu, otú a ka Ọ nēwere ha nye uta-ya.


Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Sairọs, si, Ọ bu onye-ọzùzù-aturum, ihe nile nke nātọm utọ ka ọ gēmezu kwa: ọbuná n'ikwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēwu ya; na n'isi ulo uku Chineke, Agātọ ntọ-ala-gi.


Otú a ka Jehova siri onye-Ya etere manu, bú Sairọs, onye M'jideworo aka-nri-ya, izọda mba di iche iche n'iru ya, ọ bu kwa úkwù ndi-eze ka M'gēkepu; imeghe uzọ n'iru ya, agaghi-emechibido kwa ọnu-uzọ-ama;


Mu onwem akpọtewo ya n'ezi omume, ọ bu kwa uzọ-ya nile ka M'gēme ka ha guzozie: onye ahu gēwu obodom, zilaga ndim emereri ka ha je biri n'ala ọzọ, ọ bughi n'ihi ọnu-ahia, ọ bughi kwa n'ihi iri-ngo, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Jehova we sim, N'Ugwu ka agēsi tọpu ihe ọjọ idakwasi ndi nile bi n'ala nka.


N'ihi na otù mba esiwo n'Ugwu rigoputa imegide ya, mba ahu gēme ka ala-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ dighi kwa onye ganēbi nime ya: ma madu ma anumanu, ha awaghariwo, la.


Nwanyi-irom gāhu kwa ya, ihere ewe kpuchie ya iru; bú onye nāsim, Òle ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ? Anyam abua gēlekwasi ya; ub͕u a ka ọ gāghọ ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.


Ha gādi kwa ka ndi-dike, nāzọda ndi-iro-ha n'apiti èzí nile n'agha; ha gēbu kwa agha, n'ihi na Jehova nọyere ha: ihere gēme kwa ndi nānọkwasi inyinya.


Mọ-ozi nke-isi we wusi ọkwa-ya n'elu osimiri uku ahu, bú Yufretis; miri-ya we tasia, ka ewe dozie uzọ ndi-eze ahu ndi si n'ọwūwa-anyanwu bia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan