Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 41:23 - Bible Nso

23 Gosinu ihe ahu nile gābia n'ọdi-n'iru, ka ayi we mara na chi ka unu bu: e, menu ezi ihe, ma-ọbu menu ihe ọjọ, ka ayi we lerita onwe-ayi anya gburugburu n'ujọ, hu ya n'otù.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 gwa anyị ihe ọdịnihu ji, ka anyị mara na unu bụ chi. Meenụ ezi ihe, maọbụ ihe ọjọọ, nke ga-eme ka anya gbagwojuo anyị, ka anyị jupụtakwa nʼegwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 41:23
13 Iomraidhean Croise  

Òle ebe ha nọ kwa, bú ndi-gi ndi mara ihe? biko, ka ha gosi kwa gi; ka ha mara kwa ihe Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubeworo bayere Ijipt.


Ihe mbu, le, ha abiawo, ọ bu kwa ihe ọhu di iche iche ka Mu onwem nēgosi: tutu ha epue anameme ka unu nuru ha.


Achikọtawo mba nile n'otù, kpọkọta kwa ndi nile di iche iche: ònye n'etiti ha gēgosi nka, me ka ayi nuru ihe mbu nile? Ka ha weputa ndi-àmà-ha, ka ewe gua ha na ndi ezi omume: ma-ọbu ka ha nuru, si, Ezi-okwu.


Gosinu, weta-kwa-nu ha nso; e, ka ha b͕akọ ìzù n'otù: ònye mere ka anu ihe a site na mb͕e gara aga? onye sitere na mb͕e ochie gosi ya? ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova? ọ dighi kwa Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem; Chineke Nke nēme ezi omume na onye-nzọputa adighi ma ewezuga nání Mu onwem.


M'gēnye kwa gi àkù nke ọchichiri, na àkù zoro ezo nke ebe nzuzo di iche iche, ka i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye ahu Nke nākpọ gi n'aha-gi, ọbuná Chineke Israel.


Ha nēbuli ya n'ubu, n'ebu ya, we dọba ya n'ọnọdu-ya, o we guzo; ọ gaghi-esi n'ebe-ya pua: e, madu gētiku ya nkpu, ma ọ gaghi-aza, ọ gaghi-azọputa ya n'ahuhu-ya.


Ha di ka nkwu, ihe akpuru akpu ka ha bu, ha adighi-ekwu okwu: aghaghi ibu ha ebu, n'ihi na ha adighi-azọ ije. Unu atula egwu ha; n'ihi na ha agaghi-eme ihe ọjọ, ọzọ kwa, ime izi ihe adighi ha n'aka.


na asi na unu emeghi ka m'mara nrọ a, otù ka iwu enyere unu bu: n'ihi na okwu-ugha nke bibi-kwa-ra ebibi ka unu zubekọworo ikwu n'irum, rue mb͕e mb͕e a gērughari: n'ihi nka zerem nrọ a, m'we mara na unu gākọrọm isi-ya.


Site n'ub͕u a anamagwa unu mb͕e ọ kērughi, ka unu we kwere na Mu onwem bu Ya mb͕e ọ bula ọ gēru.


Ka Onye-nwe-ayi kwuru, Onye nēme ka amara ihe ndia site na nmalite oge a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan