Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 41:15 - Bible Nso

15 Le, emewom ka i ghọ ihe-nkpọre eji azọcha ọka, bú ihe di nkọ di ọhu nwere ezé: i gāzọcha ugwu, zọpia ha, i gēme kwa ugwu ntà ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 “Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọka nke dị nkọ, nwekwa ọtụtụ eze. Unu ga-azọcha ugwu niile zọpịa ha, meekwa ka ugwu nta niile dịka igbugbo ọka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 41:15
20 Iomraidhean Croise  

Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ: Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti.


Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe: Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha.


Mba di iche iche, dika nkpọtu nke miri di ike ka ha nākpọtu: ma Ọ nābasiri ya nba ike, o we b͕alaga n'ebe di anya, anāchi kwa ya dika ib͕ob͕o-ọka nke ugwu n'iru ifufe, na dika ihe anēfeghari buruburu n'iru oké ifufe.


Gi ihe-nzọcham, na nwa nke ebe-nzọcha-ọkam: ihe m'nuworo n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ka m'gosiworo unu.


N'ihi na ejighi ihe di nkọ zọcha fitch, adigh-akpore kwa wheel nke ub͕ọ-ala buruburu n'elu cummin; kama ọ bu nkpa-n'aka ka eji ticha fitch, ọ bu kwa ndele ka eji ticha cummin.


Ma ìgwè ndi ala ọzọ nēmegide gi gādi ka ájá di ntà, ìgwè ndi nēme ka madu ma jijiji gādi kwa ka ib͕ob͕o-ọka nke nāgabiga agabiga: ọ gādi kwa n'otù ntabi-anya na mberede.


M'gēme ugwu na ugwu ntà ka ha kọ akọ, ihe-ọkukú-ha nile ka M'gēme kwa ka ọ kpọnwua; M'gēme kwa osimiri ka ha ghọ agwe-etiti, me kwa ka ọ̀dọ-miri nile takọ.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I gādọwa elu-igwe, ridata, ma asi na ugwu nile gēsi n'iru Gi rùda dika miri;


Anyu-ike-agha ka i burum na ihe-agham nile; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia mba di iche iche; ọ bu kwa gi ka M'gēji bibie ala-eze di iche iche;


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ada Babilon di ka ebe-nzọcha-ọka mb͕e anāzọcha ya; nwa mb͕e fọduru, mb͕e owuwe-ihe-ubi ewe biarue ya aru.


Ugwu nile ayi ka m'gēbuliri ikwa-ákwá na igo-ákwá, buli-kwa-ra ebe-ita-nri nile nke ọzara abù-ákwá, n'ihi na esuresiwo ha ọku, ọ we ghara idi onye ọ bula nāgabiga; anughi kwa olu anu-ulo; ma anu-ufe nke elu-igwe ma anumanu ab͕alagawo, ha alawo.


M'gēme kwa ka ala-unu ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, npako nke ike-ya gākwusi kwa; ugwu nile nke Israel gātọb͕ọ kwa n'efu, ghara inwe onye nāgabiga ha.


Mb͕e ahu ka etipiara ígwè ahu na urọ na ọla ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu n'otù, o we di ka ib͕ob͕o-ọka sitere n'ebe-nzọcha-ọka nke mb͕e okpom-ọku; ifufe we fechapu ha, ewe ghara ihuru ha ebe ọ bula: nkume ahu nke tipiara onyinyo ahu we ghọ oké ugwu, juputa uwa nka nile.


Bilie, zọcha, gi ada Zaion: n'ihi na mpi-gi ka M'gēme ka ọ ghọ ígwè, ọ bu kwa ukwu-gi ka M'gēme ka ha ghọ ọla: i gāzọpia kwa ọtutu ndi di iche iche: M'gēwezuga kwa urù-ha nye Jehova, wezuga kwa àkù-ha nye Onye-nwe uwa nka nile.


Ndi Jekob fọduru gādi kwa n'etiti mba nile, n'etiti ọtutu ndi di iche iche, dika ọdum n'etiti anumanu nke oké ọhia, dika nwa-ọdum n'etiti ìgwè ewu na aturu nile: nke gābu, mb͕e ọ gāgabiga, ọ gāzọda, dọkasia, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.


N'oké iwe ka I nāzọ ije n'ala, N'iwe ka I nāzọcha mba di iche iche dika ọka.


Ònye ka i bu, gi oké ugwu? n'iru Zerubabel i gāghọ ebe di lari: ọ gēweputa kwa nkume nke-elu n'itiri ya oké nkpu, si, Amara, amara.


n'ihi na ugwu ahu ka i gēnwe; n'ihi na oké ọhia ka ọ bu, i gēb͕utu kwa ya, i gēnwe kwa ọpupu-ya nile: n'ihi na i gānapu ndi Kenean ala-ha, ọ bu ezie na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè, ọ bu kwa ezie na ndi di ike ka ha bu.


Jehova we si ya, N'ihi na Mu na gi gānọ, i gētib͕u kwa Midian dika otù nwoke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan