Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 41:12 - Bible Nso

12 I gāchọ ha, ma i gaghi-achọta ha, bú ndi gi na ha nēse okwu: ha gādi ka ihe nābughi ihe na dika ihe-efu, bú ndi nēbuso gi agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Unu ga-ele anya ha, chọọ ha, ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ. Ndị a na-ebuso unu agha ga-abụ naanị ihe efu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 41:12
7 Iomraidhean Croise  

Na mb͕e anyasi le, oké egwu di: tutu ututu erue ọ dighi. Nka bu òkè nke ndi nāpunara ayi ihe; na ihe ruru ha n'ife-nzà, bú ndi nāluta ihe-ayi n'agha.


Ọ gādi kwa ka mb͕e onye agu nāgu nārọ nrọ, ma, le, ọ nēri ihe; o we teta, ma nkpuru-obi-ya b͕ara aka: ma-ọbu dika mb͕e onye akpiri nākpọ nku nārọ nrọ, ma, le, ọ nāṅu miri; ọ we teta, ma, le, ọ dawo #mbà, nkpuru-obi-ya nāchọsi kwa ihe ike: otú a ka ìgwè mba nile gādi, ndi nēbuso ugwu Zaion agha.


Ndi-ya amara aha-ha ka ha gākpọ inwe ala-eze, ma ọ dighi onye nọ n'ebe ahu; ndi-isi-ya nile gāghọ kwa ihe-efu.


Ma otú a ka Jehova siri, Ọbuná ndi dike dọtara n'agha ka agēwepu, ọzọ, ihe onye nēme ka madu ma jijiji wetara n'agha, agēme ya ka ọ wepuga onwe-ya; ọ bu kwa onye nāluso gi ọ̀gù, ọ bu kwa umu-gi ka Mu onwem gāzọputa.


Le, M'ganēmeso ndi ahu nile, bú ndi nēweda gi n'ala, na mb͕e ahu: M'gāzọputa kwa nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi, ọ bu kwa nwanyi nke achupuru achupu ka M'gāchikọta; M'gēme kwa ka ha ghọ otuto, ghọ kwa aha, bú ndi ihere-ha di n'uwa nka nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan