Aịzaya 40:28 - Bible Nso28 Ì maghi? ì nughi? Chineke nke mb͕e ebighi-ebi ka Jehova, Onye kèworo nsọtu nile nke uwa, bu; Ọ dighi-ada #mbà, ike adighi-agwu kwa Ya; ọ dighi ngwuputa anēgwuputa nghọta-Ya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a28 Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya. Faic an caibideil |
N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu.