Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 40:27 - Bible Nso

27 N'ìhi gini ka i nāsi, gi Jekob, ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i nēkwu, gi Israel, si, Uzọm ezonariworo Jehova, ọzọ, ikpém esiwo n'ebe Chinekem nọ gabiga?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb? Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị, “Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị, Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 40:27
10 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Ọ nēmezu ihe bu òkèm: Ma ọtutu ihe dika ihe ndia di n'aka-Ya.


Chineke nādi ndu, Onye wezugara ikpém; Onye puru ime ihe nile nādi kwa ndu, bú Onye mere ka nkpuru-obim di ilu;


N'ihi na Job siri, Abum onye ezi omume, Ma Chineke ewezugawo ikpém:


Jehova, Chinekem ka I bu; m'gēme ka I di elu, m'gēkele aha-Gi; n'ihi na I mewo ihe-ebube, bú ndum-ọdu di iche iche site na mb͕e di anya gara aga, n'ikwesi-ntukwasi-obi na ezi-okwu.


Cheta ihe ndia, Jekob; gi Israel kwa, n'ihi na orùm ka i bu: akpuwom i; orù M'nwere ka i bu: Israel, M'gaghi-echezọ gi.


Ma Zaion siri, Jehova arapuwom, Onye-nwe-ayi echezọwokwam.


Ma mu onwem siri, N'efu ka m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, n'ihi ihe tọb͕ọrọ n'efu na otù nku-ume ka m'meworo ka ikem gwusia: n'ezie ikpém di n'aka Jehova, ugwọ-ọlum di kwa n'aka Chinekem.


Na nrubiga-ókè nke iwe ka M'zonariri gi irum otù ntabi-anya; ma ebere ebighi-ebi ka M'gēji nwe obi-ebere n'aru gi, ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa-gi, siri.


Devid we si obi-ya. Ub͕u a agēkpochapum otù ubọchi site n'aka Sọl: ọ dighi ihe dirim nma kari iwepugasi onwem ba n'ala ndi Filistia; Sọl agaghi-atukwasi kwa obi-ya n'arum, ichọm ọzọ n'ókè-ala nile nke Israel: m'gēwepuga kwa onwem n'aka-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan