23 Nke nēme ndi-isi ka ha ghọ ihe-efu; Ọ mewo ndi-ikpe uwa ka ha di ka ebe tọb͕ọrọ n'efu.
23 Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa, mee ha ka ha ghọọ ihe efu.
Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha, Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.
Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha, Akpukpọ-úkwù nke ndi di ike ka Ọ kpọpu-kwa-ra.
Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha, We me ka ha kpafue nebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe uzọ nādighi.
Ọ nēb͕ochi mọ ndi-ndú: Ọ bu onye anātu egwu n'ebe ndi-eze uwa nọ.
Aghaghi ime anya npako nke madu ka ha di ala, aghaghi kwa iruda nbuli-elu nke ndi nile n'ala, aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n'ubọchi ahu.
N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere otù ubọchi nke gādakwasi ihe ọ bula di npako nke di kwa elu, ọ gādakwasi kwa ihe ọ bula ebuliworo elu; ewe me ya ka ọ di ala:
Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo ya, ime ka npako nke ima-nma nile ghara idi nsọ, ime ka elelìa ndi-nsọpuru nile nke uwa.
Ndi-ya amara aha-ha ka ha gākpọ inwe ala-eze, ma ọ dighi onye nọ n'ebe ahu; ndi-isi-ya nile gāghọ kwa ihe-efu.
Ahuhu gādiri ndi mara ihe n'anya ha onwe-ha, ndi nēle kwa onwe-ha anya na ha bu ndi-nghọta!
M'gēbipu kwa onye-ikpe n'etiti ya, b͕ue ya na ndi-isi-ya nile; otú a ka Jehova siri.