O we si ha, Jerenu onwe-unu, rie ihe mara abuba, ṅua ihe-ọṅuṅu di utọ, were òkè zigara ndi ọ nādighi ihe edoziworo ha: n'ihi na nsọ ka ubọchi ta diri Onye-nwe-ayi: ihe ewuta-kwa-la unu; n'ihi na ọṅù Jehova bu ike-unu.
Onye n'etiti unu bu onye nātu egwu Jehova, nēge nti n'olu orù-Ya? onye nke jeworo ije n'ọchichiri, nke ọ dighi onwunwu-ọku o nwere, ya tukwasi obi n'aha Jehova, dabere Chineke-ya.
Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu nākasi unu obi; ònye ka i bu, na i nātu egwu madu gānwu anwu, na i nātu egwu nwa madu nke agēme ka ọ di ka ahihia;
N'ihi na Jehova akasiwo Zaion obi: Ọ kasiwo nkpọnkpọ ebe-ya nile, me ka ọzara-ya di ka Iden, me ka ala-ya nke ihe nādighi di ka ubi Jehova ab͕ara ogige; obi-utọ na ọṅù ka agāhu nime ya, na ekele, na olu abù ọma.
Kpọsa ọzọ, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obodom nile gēsite n'ezi ihe b͕asa ọzọ; Jehova gākasi kwa Zaion obi ọzọ, rọputa Jerusalem ọzọ.
Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.
Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.