Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 4:1 - Bible Nso

1 Ọzọ, ndinyom asa gējide otù nwoke n'ubọchi ahu, si Nri nke aka ayi ka ayi gēri, uwe nke aka ayi ka ayi gēyi kwa: ọ bu nání na agākpọkwasi ayi aha-gi; gi wepu ita-uta-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nʼoge ahụ, ndị ikom ole na ole ga-afọdụ ndụ. Nke a ga-eme ka ndị inyom asaa na-azọ otu nwoke. Ha ga-abịakwute ya sị ya “Kwere ka anyị niile bụrụ ndị nwunye gị! Anyị ga-akpara onwe anyị nri, zụọra onwe anyị akwa. Naanị kwere ka anyị na-aza aha gị, ka a ghara ịkọ anyị ọnụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 4:1
15 Iomraidhean Croise  

Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke, si, Chineke ekpochapuwo ita-utam:


Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, o nweghi nwa rue ubọchi ọnwu-ya.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ndi Israel fọduru, ha na ndi ulo Jekob ndi bapuru ab͕apu, agaghi-adabere kwa ọzọ n'aru onye nētib͕u ha; kama ha gādabere Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, n'ezi-okwu.


M'gēme ka madu di ukọ kari ọla-edo anuchara anucha, ọbuná madu efu kari ọla-edo ọma nke Ofia.


N'ubọchi ahu ka madu gēle Onye kèworo ya anya ọma, anya-ya abua gēlekwasi kwa Onye Nsọ nke Israel.


Aghaghi ime anya npako nke madu ka ha di ala, aghaghi kwa iruda nbuli-elu nke ndi nile n'ala, aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n'ubọchi ahu.


Aghaghi kwa iruda npako madu, aghaghi kwa ime nbuli-elu nke ndi nile ka ọ di ala: aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n'ubọchi ahu.


Mb͕e otù onye gējide nwa-nne-ya n'ulo nna-ya, si, I nwere uwe-nb͕okwasi, onye-ikpe ka i gāburu ayi, ka ihe-isu-ngọngọ a di kwa n'okpuru aka-gi:


Atula egwu; n'ihi na ihere agaghi-eme gi: ka aghara itiye kwa gi n'ọnọdu-ihere; n'ihi na agaghi-eme gi ka i nwe iru-ihere: n'ihi na i gēchezọ ihere nke mb͕e i nọ na nwata, ọzọ, ita-uta nke ọnọdu nwayi di-ya nwuru i nọ, i gaghi-echeta ya ọzọ.


Ndinyom-ha di-ha nwuru ababigaworom uba ókè kari ájá nke oké osimiri nile: emewom ka onye nke nāpunara madu ihe biakute ha n'etiti-ehihie imegide nne nke umu-okorọbia: emewom ka nhuju-anya na obi-ọlulọ-miri dakwasi ya na mberede.


Otú a ka Onye-nwe-ayi meworo nyem n'ubochi O ji lem anya, iwepu ita-utam n'etiti madu.


N'ihi na ndia bu ubọchi nkpeputa, ka ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu.


Ma ndi di otú a ka ayi nēnye iwu nāriọ kwa aririọ nime Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka ha were nwayọ nālu ọlu, ri kwa nri nke aka ha.


Onye-nkpab͕u-ya we kpasue ya iwe nke-uku, imekpa ya aru, n'ihi na Jehova mechiri àkpà-nwa-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan