Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 39:2 - Bible Nso

2 Hezekaia we ṅuria ọṅu bayere ha, me ka ha hu ulo nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo nile nke ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n'àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n'ulo-ya, ma-ọbu n'ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Hezekaya nabatara ndị ozi ahụ nke ọma gosi ha ihe ndị dị nʼụlọakụ ya, ọlaọcha, na ọlaedo, ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ, ezigbo mmanụ oliv, ụlọ niile ebe ngwa agha ya niile dị, na ihe niile bụ akụ o nwere. Ọ dịghị ihe dị nʼụlọeze ya maọbụ nʼalaeze ya niile nke ọ na-egosighị ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 39:2
18 Iomraidhean Croise  

O nye eze ọgu talent ọla-edo isi, na uda di iche iche bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: ọ dighi uda biara ọzọ nke di ka uda ahu n'iba-uba, bú nke eze-nwayi Sheba nyere eze, bú Solomon.


nāgughi ihe ndikom ndi nējeghari izu ahia wetara, na ọzuzu-ahia nke ndi nāzu ahia, na ọla-edo nke eze nile nke ndi gwara ọgwa, na ọla-edo nke ndi nāchi ala.


Ọ biarue Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, gwa ya okwu nile nke di ya n'obi.


Ndi ahu nēbute kwa, nwoke ọ bula onyinye-inata-iru-ọma-ya, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, na ihe-ekike-agha, na uda di iche iche, na inyinya, na inyinya mule, ihe anēnye n'arọ n'arọ-ya.


Hezekaia we ge ha nti, me ka ha hu ulo nile nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n'àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n'ulo-ya, ma-ọbu n'ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu.


Ma ọ bughi dika nmeso emesoro ya ka Hezekaia nyeghachiri; n'ihi na obi-ya di elu: iwe we dikwasi ya, dikwasi kwa Juda na Jerusalem.


Hezekaia we nwe àkù na nsọpuru riri nne nke-uku: o we mere onwe-ya ulo-àkù idebe ọla-ọcha, na idebe ọla-edo, na idebe nkume di oké ọnu-ahia, na idebe uda di iche iche, na idebe ọta, na idebe ihe nile anāchọsi ike;


Otú ọ di, n'okwu ndi-ukọ nke ndi-isi Babilon, ndi zitere ya ozi iju ajuju bayere ihe-ebude nke mere n'ala, Chineke rapuru ya inwa ya, ka O we mara ihe nile di n'obi-ya.


Ma eze-nwayi Sheba nuru akukọ Solomon, we bia iwere ilu di iche iche nwa Solomon nime Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, na camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo n'uba, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, kpayere ya uka nile nke di ya n'obi.


O nye eze ọgu talent ọla-edo isi, na uda di iche iche n'uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: ọ dighi uda di ka uda ahu nke eze-nwayi Sheba nyere eze, bú Solomon.


Ọ buru na aṅuriam ọṅu n'ihi na àkùm riri nne, Na n'ihi na akam achọtawo àkú uku;


Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di.


N'ezie ọ dighi onye ezi omume n'uwa, nke nēme ezi ihe, nādighi-emehie kwa.


Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya?


N'ihi ọkika nke nkpughe ndia-n'ihi ya, ka ewe ghara iwelibigam ókè, enyerem ogwu n'anu-arum, bú mọ-ozi nke Setan, ka o we tiem aka, ka ewe ghara iwelibigam ókè.


Ọ buru na ayi asi na ayi enweghi nmehie, ayi nēduhie onwe-ayi, ezi-okwu ahu adighi kwa nime ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan