Hezekaia, bú eze, na ndi-isi we si ndi Livai ka ha were okwu nke Devid, na nke Esaf, bú onye-ọhu-uzọ, to Jehova. Ha we to Chineke rue ọṅù, ha we rube isi kpọ isi ala.
le, M'nēme ka onyinyo nke di n'ebe-nrigo, nke ridaworo n'ebe-nrigo Ehaz site n'anyanwu, ka ọ la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri. Anyanwu we la azu nzọ-ukwu ebe-nrigo iri n'ebe-nrigo ahu nke ọ ridaworo n'elu ya.
Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya, Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ: Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu; M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike: Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam.