Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 38:20 - Bible Nso

20 Jehova ejikerewo izọputam: Ubọ-akwaram nile ka ayi ganākpọ Ubọchi nile nke ndu-ayi n'ulo Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Onyenwe anyị ga-azọpụta m, anyị ga-abụ abụ kpọọ ụbọ akwara nʼụbọchị niile nke ndụ anyị, nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 38:20
19 Iomraidhean Croise  

M'gābùku Jehova abù n'ogologo ndum nile: M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu.


N'ihi na Ọ tọwo nti-Ya n'ala n'ebe m'nọ, Ogologo ubọchi nile nke ndum ka m'ga-akpọku kwa Ya.


M'gēme Gi ka I di elu, Chinekem, bú Eze; M'gāgọzi kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Kwa-ubọchi ka m'gāgọzi Gi; M'gēto kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.


M'gēto Jehova n'ogologo ndum nile: M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu.


Werenu egwú-otiti na ite-egwú to Ya: Chirinu ubọ eji akwara kwe na ọ̀jà to Ya:


Tienu nkpu ọṅù nime Jehova, unu ndi ezi omume: N'ebe ndi ziri ezi nọ otuto mara nma.


Werenu ubọ-akwara kele Jehova: Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma.


Onye-nwe-ayi, I gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum abua; Ọnum gēgosi kwa otuto-Gi.


Ha ahuwo ojije-Gi nile, Chineke, Bú ojije nile nke Chinekem, bú Ezem, n'idi-nsọ-Ya.


Ndi-abù buru uzọ ga, ndi-ubọ-akwara soro n'azu, N'etiti umu-ab͕ọghọ ndi nēti egwú-otiti.


Le, Chineke bu nzọputam; m'gātukwasi Ya obi, ghara itu egwu: n'ihi na ikem na abù ọmam ka Ja JEHOVA bu; O we ghọrọm nzọputa.


Jehova we gwa azù ahu okwu, o we b͕ọputa Jona n'ala-akọrọ.


Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem, Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele, Ọ bu kwa n'ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M'zọ ije. Ọ diri Onye-isi Abù, n'ubọ-akwaram nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan