Ge kwa nti aririọ-amara orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, mb͕e ha nēkpe ekpere n'ebe ebe a di: Gi onwe-gi nuru kwa n'ebe obibi-Gi, n'elu-igwe; mb͕e I nuworo, Gi b͕aghara.
Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na onye nānwu anwu ka i bu, I gaghi-adi kwa ndu.
si, Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.
Ma gi onwe-gi, mb͕e ọ bula i nēkpe ekpere, bà n'ime-ulo ntà gi, mb͕e i mechisi-kwa-ra uzọ-gi, kpere Nna-gi Nke di na nzuzo, Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi.