Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 38:12 - Bible Nso

12 Emewo ka ebe-obibim bulie ije, esiwo kwa n'ebe m'nọ bulaga ya dika ulo-ikwū onye-ọzùzù-aturu: Apiakọtawom ndum dika ọkpa-ákwà si apiakọta ákwà; na ǹkwé-ákwà ka Ọ gēbipum: Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ. Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa o bipụla ndụ site nkwe-akwa, ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 38:12
20 Iomraidhean Croise  

Dika okoko-osisi ka ọ putaworo, ewe nēbipu ya: O we nāb͕alaga dika onyinyo, ọ dighi-eguzo kwa.


Emebiwo mọm, emewo ka ubọchim gwusia, Ílì dirim.


Site n'ututu rue anyasi anētib͕u ha: Ha nāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi, ma ọ dighi onye nātukwasi ya obi.


Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam; Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum.


Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu; Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n'ala.


Ọzọ, ndi-isi nọduru ala kwurita okwu imegidem: Ma orù-Gi nātughari uche n'ukpuru-Gi nile.


Ma mu onwem, asirim na nkujam, Ebipuwom n'anya-Gi: Otú ọ di, I nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi.


Buru kwa onye anēti ihe ogologo ubọchi nile, Onye iba-nbam di kwa-n'ututu.


I wuchapuwo ha dika oké miri-ozuzo; nání ura ka ha bu: N'ututu ha di ka ahihia nētó etó.


Ma ada Zaion fọduru dika ulo-ntu n'ubi-vine, dika ulo-ọnọdu-abali n'ubi cucumbei, dika obodo nke ndi-iro-ya nēche nche.


Ọ gaghi-abu ebe-obibi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ebi kwa nime ya rue ọb͕ọ nile: onye Arebia agaghi-ama kwa ulo-ikwū-ya n'ebe ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-eme kwa ka aturu-ha makpue n'ebe ahu.


N'ihi na ayi matara na asi na akwaturu ulo nke uwa, bú ulo-ikwū-ayi, ayi nwere ulo ewuru nke sitere na Chineke, ulo anējighi aka wu, di ebighi-ebi, n'elu-igwe.


N'ihi na ayi, bú ndi nọ n'ulo-ikwū a, ayi nāsu udè ezie, ebe ọ nānyib͕u ayi; n'ihi na ayi achọghi ka eyipu ayi ya, kama ka eyikwasi ayi ihe n'elu ya, ka ndu we loda ihe puru inwu anwu.


Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāpiakọta kwa ha, Dika uwe, agāb͕anwe kwa ha: Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile, Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu.


ma unu bu ndi nāmataghi ihe gēme echi. Ǹdu-unu bu gini? N'ihi na unu bu alulu, nke nāputa ìhè nwa oge, emesia ọ we pua n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan