Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 38:1 - Bible Nso

1 Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na onye nānwu anwu ka i bu, I gaghi-adi kwa ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 38:1
16 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Mb͕e nwa ahu nọ na ndu, eburum ọnu, kwa ákwá' n'ihi na m'siri, Ònye mara? eleghi anya Jehova gēmerem amara, ka nwa ahu we di ndu.


Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya.


Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria rue inwu: o we kpere Jehova; O we gwa ya okwu, nye ya ihe-ebube.


Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.


Ọhù Aisaia nwa Emoz, nke ọ huru bayere Juda na Jerusalem n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda.


Ọ we zìe Elaiakim, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ na ndi okenye ndi-nchu-àjà, ndi wereworo ákwà-nkpe kpuchie onwe-ha, o we zìe ha jekuru Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma.


Aisaia nwa Emoz we zigara Hezekaia ozi, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ekpere nke i kpeworom bayere Senakerib, bú eze Asiria, anuwom ya.


Chineke we hu ọlu nile ha, na ha siri n'uzọ ọjọ ha chigharia; Chineke we chègharia uche bayere ihe ọjọ ahu, nke O kwuru, si na Ọ gēme ha; O meghi kwa ya.


Jona we malite ibà n'obodo ije nke otù ubọchi, o we kpọsa, si, Ọ fọduru ọgu ubọchi abua, ewe kwatue Nineve.


Ma o ruru n'ubọchi ahu, na aru-ya adighi ike, o we nwua: mb͕e ha sasiri ya aru, ha tọbọ ya n'ime-ulo di n'elu ulo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan