Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 37:36 - Bible Nso

36 Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 37:36
29 Iomraidhean Croise  

Mọ-ozi we setipu aka-ya n'ebe Jerusalem di ibibi ya, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu we si mọ-ozi ahu nke nēbibi n'etiti ndi Israel, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nọ n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.


O rue, n'abali ahu, na mọ-ozi nke Jehova puru, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.


ma ọ bu oké unwu arọ atọ; ma-ọbu ka ekpochapu gi ọnwa atọ n'iru ndi nākpab͕u gi, ọbuná mma-agha ndi-iro-gi nēru gi aru; ma-ọbu mma-agha Jehova ubọchi atọ, bú ajọ ọria nēfe efe n'ala, mọ-ozi nke Jehova nēbibi kwa n'ókè-ala nile nke Israel. Ma ub͕u a le okwu m'gēweghachiri Onye nēzitem.


Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n'etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n'aka-ya, nke esetiri n'elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n'ala.


Ha di elu; na nwa mb͕e ha anọghi; Akwadawo kwa ha, chikọba ha dika madu nile, Ewe bipu ha dika ọnu-ọnu oko ọka.


N'otù ntabi-anya ka ha gānwu, ọbuná n'etiti abali; Anēme ka ndi ahu me nkpatu, ha nāgabiga kwa, Anēwezuga kwa onye di ike, nēweghi aka ọ bula.


N'ihi na Jehova gāgabiga iti ndi Ijipt ihe; ma mb͕e Ọ huru ọbara ahu n'elu elu-uzọ na n'elu awara-uzọ abua, Jehova gāgabiga ọnu-uzọ ahu, Ọ gaghi-ekwe onye-nbibì ahu ka ọ ba n'ulo-unu iti unu ihe.


Fero we bilie n'abali, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya nile, na ndi Ijipt nile; oké iti-nkpu we di n'Ijipt; n'ihi na ọ dighi ulo ebe onye nwuru anwu nādighi.


Ọ gēru kwa, mb͕e Onye-nwe-unu gālubì ọlu-Ya nile n'ugwu Zaion na nime Jerusalem, na M'gēleta nkpuru nke oké obi eze Asiria, leta kwa ima-nma nke anya npako ya.


N'ihi na ọ fọduru nwa mb͕e ntà, oké iwe ewe gwusia, iwem gēme kwa ka ha ka nká.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēfeghari kwa utali n'elu ya, dika ntib͕u Midian n'oké nkume Oreb: nkpa-n'aka-Ya gādi kwa n'elu oké osimiri, Ọ gēweli kwa ya otú O mere n'Ijipt.


Ọ̀ bu dika ntib͕u nke onye nētib͕u ya-ri ka O tib͕uworo ya? ma ọ̀ bu dika ob͕ub͕u nke ndi o nēb͕uri ka eb͕uworo ya?


Ma ìgwè ndi ala ọzọ nēmegide gi gādi ka ájá di ntà, ìgwè ndi nēme ka madu ma jijiji gādi kwa ka ib͕ob͕o-ọka nke nāgabiga agabiga: ọ gādi kwa n'otù ntabi-anya na mberede.


Asiria gāda kwa site na mma-agha nke nābughi nke madu di elu: mma-agha nke nābughi nke madu di ala gērichapu kwa ya: ọ gēsi kwa n'iru mma-agha b͕alaga, umu-okorọbia-ya gāghọ kwa usu ndi nēfè òfùfè.


Nebukadneza zara, si, Onye agọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego bu, Onye ziteworo mọ-ozi-Ya, we naputa ndi-orù-Ya ndi tukwasiri Ya obi, ọ bu kwa okwu eze ka ha b͕anweworo, we rara aru-ha nye, ka ha we ghara ifè ma-ọbu ikpọ isi ala nye chi ọ bula, ma-ọbughi Chineke-ha.


Ha gēji kwa mma-agha b͕uchapu ala Asiria na ala Nimrod n'ọnu-uzọ-ya nile: ọ gānaputa kwa ayi n'aka Asiria, mb͕e ọ gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ókè-ala-ayi.


Otú a ka Jehova siri: Ọ bu ezie na ha zuru okè, ba kwa uba otú a, ọbuná otú a ka agēb͕utu ha, ọ gāgabiga kwa. Ọ bu ezie na ewedawom i n'ala, ma M'agaghi-eweda kwa gi n'ala ọzọ.


na onye-inyinya nēme ka inyinya-ya rigo, na mma-agha nēb͕upu eb͕upu, na ube nēb͕u àmùmà; na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u, na oké obo ozu; ọ dighi kwa ọgwugwu diri ozu-ha; ha nāsu ngọngọ n'ozu-ha:


Ngwa ngwa mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we tie ya ihe, n'ihi na ọ nyeghi Chineke otuto ahu: ikpuru we tab͕ue ya, o we kubìe ume.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan