Ma alurum ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi ha onwe-ha nọ n'etiti ha, ndi M'mere ka ha maram n'anya-ha, n'ime ka ha si n'ala Ijipt puta.
N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bughi n'ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, unu ulo Israel, kama ọ bu n'ihi aha nsọm, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile ebe unu biara.
Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi ha; ha gēripia kwa, zọda nkume èbè nile; ha gāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me nkpọtu dika site na manya-vine: ha gējuputa kwa dika ọkwa-nwusa, dika nkuku nile nke ebe-ichu-àjà.
Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro, Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie, Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu, Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile.