Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 37:31 - Bible Nso

31 Ndi b͕apuru ab͕apu nke ulo Juda ndi fọduru gāb͕agide kwa nkpọrọgwu n'ala n'okpuru ọzọ, mi kwa nkpuru n'elu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 37:31
18 Iomraidhean Croise  

I doziri ọnọdu n'iru ya, O we b͕amie nkpọrọgwu, we juputa ala ahu.


Ha gānọ nāmi nkpuru n'isi-awọ; Osisi nke miri di ha n'aru ri nne, nke nwezu-kwa-ra akwukwọ ndu, ka ha gābu.


Ọ buru na Jehova nke usu nile nke ndi-agha emeghi madu ole-na-ole nke fọduru ka ha fọduru ayi, ayi gādiwori ka Sọdọm, ayi gēyiwori Gọmọra.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Onye-nwe-ayi gēseti kwa aka-Ya ọzọ nke ub͕ò abua inweta ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n'Asiria, site kwa n'Ijipt, site kwa na Patros, site kwa na Kush, site kwa n'Ilam, site kwa na Shaina, site kwa na Hemat, site kwa n'agwe-etiti nile nke oké osimiri.


N'ọdi-n'iru Jekob gāb͕a nkpọrọgwu: Israel gāb͕awa okoko dika osisi, ma ifuru: ha we mejue iru elu-uwa dum madu bi n'ihe-omume.


Eleghi anya Jehova, bú Chineke-gi, gānu okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bú onye-nwe-ya, ziteworo ita Chineke di ndu uta, eleghi anya Ọ gābara okwu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nuworo nba: gi buli kwa ekpere-gi n'ihi ndi fọduru ndi ahutaworo.


N'ubọchi ahu ka ihe-opupú nke Jehova gāghọ ihe mara nma na ihe-nsọpuru, nkpuru nke ala gāghọ-kwa-ra ndi Israel b͕apuru ab͕apu nbili-elu na ima-nma.


Ma ọ buru na otù uzọ n'uzọ iri afọdu nime ya, aghaghi irechapu kwa ya ọzọ: dika osisi terebinth, na dika osisi oak, nke ogwe fọduru ha mb͕e eb͕utusiri ha; nkpuru nsọ bu ogwe-ya.


M'gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M'rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n'ebe ahu.


Ekele na olu nke ndi-ngwuri gēsi kwa nime ha puta: M'gēme kwa ka ha ba uba, ha agaghi-adi kwa ole-na-ole; M'gēme kwa ka ha di nsọpuru ha agaghi-adi kwa ntà.


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Werenu ọṅù tiere Jekob nkpu ọṅù, tisi-kwa-nu nkpu ike n'isi mba nile: menu ka anuru ya, tonu, si-kwa-nu, Jehova, zọputa ndi-Gi, bú Israel fọduru.


Ma ndi b͕apuworo na mma-agha gēsi n'ala Ijipt laghachi n'ala Juda, ndikom ole-na-ole; ndi Juda nile fọduru, bú ndi biaruworo ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ewe mara onye okwu-ya gēguzosi ike, nkem, ma-ọbu nke ha.


Ma ndi-ha b͕apuru ab͕apu gāb͕apu, nọ n'ugwu nile dika nduru nke ndagwurugwu, ha nile nēkwo ákwá, onye ọ bula n'ajọ omume-ya.


Ya mere otú a n'oge di ub͕u a ndi fọduru aputawo kwa dika nrọputa nke amara si di.


Ma Aisaia nēti nkpu bayere Israel, si, Ọ buru na ọnu-ọgugu umu Israel di ka ájá nke oké osimiri, ọ bu nke fọduru ka agāzọputa:


Ma ọ buru na unu onwe-unu bu ihe di n'aru nke Kraist, ya mere unu bu nkpuru Abraham, buru ndi-nketa dika nkwa si di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan