Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 37:25 - Bible Nso

25 Mu onwem egwuwo olùlù-miri, ṅua miri, m'gēwere kwa ọbu-ukwu nke nzọli-ukwum me ka osimiri Nail nile nke Ijipt tasia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 37:25
8 Iomraidhean Croise  

Ben-hedad we zigara ya ozi, si, Ka chi mem otú a, ka ha mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ájá Sameria gēzu nju-aka inye ndi nile nọ n'ukwum.


N'ihi na ọ siwo, Site n'ike akam ka m'meworo ya, na site n'amam-ihem; n'ihi na enwerem nghọta: m'we wezuga ókè ndi nile di iche iche, ọzọ, ihe-ha nke ejikereworo ka m'punara ha, m'we buda, dika onye di ike, ndi nānọdu n'ọche-eze;


akam achọtawo kwa àkù ndi nile di che iche dika akwu; na dika madu si achikọta àkwá arapuru arapu, otú a uwa nile ka mu onwem chikọtaworo: ma ọ dighi nke nēmeghari nkù, ma-ọbu nke nāsaghe ọnu, ma-ọbu nke nēbe ebe.


Ọzọ, miri gātada n'oké osimiri, osimiri gātasia takọrọ.


Osimiri-ya nile gēsì kwa ísì; osimiri Nail nile nke Ijipt gātalata we tasia: amì na achara gājanwu.


Rabshake we si, Ọ̀ bu ijekuru onye-nwe-gi na ijekuru gi ka onye-nwem ziterem ikwu okwu ndia? ọ̀ bughi n'ihi ndikom ahu ndi nānọdu n'elu mb͕idi, ka ha we soro unu rie ǹsí-ha, ṅu kwa ma-amiri?


N'ihi na ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, ọ bughi dika ala Ijipt ka ọ bu, ebe unu si puta, ebe i nāgha nkpuru-gi, were ukwu-gi nāb͕a ya miri, dika akwukwọ nri ubi ab͕ara ogige:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan