Aịzaya 37:19 - Bible Nso19 ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku: n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'iyì. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a19 ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa. Faic an caibideil |
ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh: