Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 37:12 - Bible Nso

12 chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Eden, ndi nọ na Telasa?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Chi niile nke mba niile, ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden ndị nọ na Tel Asa?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 37:12
19 Iomraidhean Croise  

Tira we chiri Abram, bú nwa-ya nwoke, na Lot, bú nwa-nwoke nke Heran, ya bu nwa nwa-ya, na Serai, bú nwunye nwa-ya, bú nwunye Abram nwa-ya nwoke; ha na ha we si n'Ua nke ndi Kaldea pua, ije ala Kenean; ha biarue Heran, biri n'ebe ahu.


Ubọchi nile nke Tira we buru ọgu arọ iri na arọ ise: Tira we nwua nime Heran.


O rue, mb͕e Abram batara n'Ijipt, na ndi Ijipt huru nwayi ahu na nwayi mara nma nke-uku ka ọ bu.


Jehova, bú Chineke, we kua ubi nke ab͕ara ogige n'Iden, n'Iru-anyanwu; O we tinye madu ahu n'ebe ahu, bú onye Ọ kpururi.


Jekob we pua na Bia-sheba, nēje Heran.


Jekob we si ha, Umu-nnem, òle ebe unu si bia? Ha si, Heran ka ayi si bia.


N'arọ nke-iteghete nke Hoshea ka eze Asiria were Sameria, me ka Israel je biri n'Asiria, me ka ha biri nime Hala, na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia.


Eze Asiria we me ka Israel je biri n'Asiria, o we me ka ha nọdu nime Hala na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia:


Chi nile nke mba nile ọzọ hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Edem, ndi nọ na Telasa?


Lezienu anya ka Hezekaia we ghara irafu unu, si, Jehova gānaputa ayi. Chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo, onye ọ bula ala-ya, n'aka eze Asiria?


Òle ebe chi nile nke Hemat na Apad di? òle ebe chi nile nke Sefavaim di? hà anaputawo kwa Sameria n'akam?


Òle ndi n'etiti chi nile nke ala ndia ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n'-akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n'akam?


Òle ebe eze Hemat di, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva?


Heran na Kane na Eden, ndi-ahia Sheba, Asiria, Kilmad, ndia bu ndi-ahia-gi.


N'Iden, bú ubi Chineke ab͕ara ogige, ka i nọworo; nkume nile ọ bula nke di oké ọnu-ahia bu ihe-nkpuchi-gi: bú sardius, na topaz, na diamond, na beryl, na onyx, na jasper, na sapphire, na esmerald, na carbuncle, na ọla-edo: ije-ozi nke egwú-otiti-gi nile na ọ̀jà-gi nile di nime gi; n'ubọchi ekère gi, mb͕e ahu ka edoziri ha.


M'gētiji kwa nkpọrọ Damaskọs, si na ndagwurugwu Even bipu onye bi ya, si kwa n'ulo Eden bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze: agēme kwa ka ndi Siria je biri n'ala ọzọ, bú Kia; otú a ka Jehova siri.


O we si, Umu-nnam na ndi bu nnam, nurunu. Chineke nke ebube mere ka nna-ayi Abraham hu Ya anya, mb͕e ọ nọ na Mesọpọtemia, mb͕e ọ kēbighi na Heran,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan