Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 36:22 - Bible Nso

22 Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Mgbe Eliakịm nwa Hilkaya, onyeisi ọchịchị, na Shebna ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, ode akwụkwọ akụkọ eze laghachikwuuru Hezekaya, ha dọwara uwe ha mgbe ha na-aga igosi ya ịda mba nke obi ha. Ha gwakwara ya ihe niile onyeisi agha ndị Asịrịa kwuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 36:22
12 Iomraidhean Croise  

Ha we kpọ eze òkù, Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we pukuru ha.


O rue, mb͕e eze Israel guru akwukwọ ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu Chineke ka m'bu, ime ka madu nwua na ime ka madu di ndu, na nwoke a nēziterem ozi ime ka nwoke si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta? ma otú ọ di, biko, maranu hu kwa na ya onwe-ya nāchọ uzọ isi megidem.


Ma mb͕e m'nuru okwu a, adọwaram uwem na uwe-nwudam, ropu kwa ufọdu n'agiri-isi nke isim na aji afu-ọnum, m'we nọdu, ibobo we nwuam n'aru.


Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Je, bakuru odozi-àkù a, bú Shebna, nke bu onye-isi ulo, si,


Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gākpọ orùm. bú Elaiakim nwa Hilkaia:


M'gākpab͕u kwa Eriel, ize-ume na isu-ude gādi kwa: o we dirim ka Eriel.


Le, dìnkpà-ha nile nēti nkpu n'èzì: ndi-ozi udo nākwakpọ anya.


Elaiakim na Shebna na Joa we si Rabshake, Biko, gwa ndi-orù-gi okwu n'asusu Siria; n'ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: agwa-kwa-la ayi okwu n'asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n'elu mb͕idi.


Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we pukuru ya.


Ma ha atughi oké egwu, ha adọwaghi kwa uwe-ha, bú eze na ndi-orù-ya nile ndi nānu okwu ndia nile.


Mb͕e ahu onye-isi-nchu-àjà dọwara uwe-ya nile, si, O kwuluru Chineke: ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ? le, ub͕u a ka unu nuru nkwulu ahu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan