Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 35:3 - Bible Nso

3 Menu aka kudara akuda ka ha di ike, b͕a-kwa-nu ikperè nāsu ngọngọ ume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Meenụ ka aka ndị ahụ kụdara akụda dịkwa ike, gbaakwanụ ụkwụ ndị ahụ na-asọ ngọngọ ume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 35:3
16 Iomraidhean Croise  

Ndi nile nke nọ ha buruburu we were ihe ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo na ihe di oké ọnu-ahia, nāgughi ihe nile enyere n'afọ-ofufo, me ka aka-ha di ike.


M'gēwere ọnum b͕a unu ume, Nmeghari eb͕ub͕ere-ọnum gēb͕ochi kwa ihe-nb͕u-unu.


Ma aka Moses abua di arọ́; ha we were nkume, tiye ya n'okpuru ya, ọ nọkwasi ya; Eron na Hua we jide aka-ya abua elu, otù onye n'otù akuku, ibe-ya n'akuku ọzọ; aka-ya abua we nēguzosi ike rue ọdida-anyanwu.


Otù onye nke di ka madu n'ile ya anya we metukwam aka ọzọ, me ka m'di ike.


N'ubọchi ahu ka agāsi Jerusalem, Atula egwu: gi Zaion, ekwela ka aka-gi abua kuda.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ka aka-unu di ike, unu ndi nānu n'ubọchi ndia okwu ndia n'ọnu ndi-amuma ahu, ndi nọ n'ubọchi mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú ulo uku Ya, ka ewe wue ya.


ma Mu onwem riọrọ aririọ bayere gi, ka okwukwe-gi ghara igwu agwu: gi-onwe-gi, mb͕e i gēchighariwori, gi me kwa ka umu-nna-gi guzosie ike.


Ewe me ka Ọ hu mọ-ozi nke si n'elu-igwe bia, nēnye Ya ike.


Mb͕e ọ nọsiri n'ebe ahu oge ufọdu, ọ pua, we nāgabiga nime ala Galetia na Frijia n'usoro, nēme ka ndi nile ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike.


N'ihi nka menu aka nēruda eruda na ikperè nwuworo anwu ka ha guzozie:


i gānu kwa ihe ha nēkwu: emesia agēme kwa ka aka-gi abua di ike ka i we rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu. O we rida, ya onwe-ya na Pura, bú nwa-okorọbia-ya, rue nsọtu ndi chiri ihe-ekike-agha, ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū ahu.


Ọ si ya, Atula egwu: n'ihi na aka nnam, bú Sọl, agaghi-achọta gi; gi onwe-gi gābu kwa eze Israel, mu onwem gābu-kwa-ra gi onye nke-abua; ọzọ kwa, Sọl, bú nnam, mara nka.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan