Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 34:7 - Bible Nso

7 Atu gēso kwa ha rida, umu-oke-ehi kwa, ha na oke-ehi; ala-ha gāṅuju kwa ọbara afọ, agēme kwa ka ájá-ha ma abuba site n'abuba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa, ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta. Ala ga-ejupụta nʼọbara ha. Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 34:7
15 Iomraidhean Croise  

Zọputam n'ọnu ọdum; Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom.


Basiere anu-ọhia nke amì nba ike, Ìgwè oke-ehi, ha na umu-ehi nke ndi nile di iche iche, Onye ọ bula nime ha nēkwe ka azọtọ ya n'ukwu nēweta iberibe ọla-ọcha; Ọ chusawo ndi nile di iche iche ndi ilu-ọ̀gù nātọ utọ.


Ma I mewo ka mpim di elu dika mpi atu: Ejiwo manu ọhu wusam.


M'we zọda ndi di iche iche n'iwem, me ka ha ṅubiga ihe-ọṅuṅu nābà n'anya n'ọnumam, M'we me ka ọbara-ndu-ha ruda n'ala.


Kwasienu ákwá ike, unu ndi-ọzùzù-aturu, ti-kwa-nu nkpu; turu-kwa-nu na ntu, unu ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu: n'ihi na ubọchi-unu eruzuwo ka eb͕ue unu, M'gākpasa kwa unu, unu gāda kwa dika ihe anāchọsi ike.


Ọzọ, ndi-ya egoro agha ndi nọ n'etiti ya di ka umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba; n'ihi na ha onwe-ha elewo anya n'azu, ha ab͕alagawo n'otù, ha eguzogh: n'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha abiakwasiwo ha, bú mb͕e nleta-ha.


N'ihi na unu nāṅuri ọṅu, n'ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n'ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike;


Gbuenu oke-ehi-ya nile; ka ha rida ka ewe b͕ue ha: ahuhu diri ha! n'ihi na ubọchi-ha abiawo, bú mb͕e nleta-ha.


M'gēde kwa ọbara-gi n'ala dika miri, bú ebe i nēgwu miri, rue ugwu nile; ebe nile miri si erù gējuputa na gi.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Si nnunu nile di iche iche, si kwa anu ọhia nile ọ bula, Chikọtanu onwe-unu, bia; zukọputanu n'akuku nile di buruburu, n'ihi àjàm nke Mu onwem nāchuru unu, bú àjà di uku M'nāchu n'elu ugwu nile nke Israel, ka unu we rie anu, ṅu kwa ọbara.


Anu-aru ndi-dike ka unu gēri, ọ bu kwa ọbara ndi-isi nke uwa ka unu gāṅu, nke ebulu, na nke umu-aturu, na nke ewu, na nke oké-ehi, anu gbara abuba nke Beshan ka ha nile bu.


Chineke nēme ka ha si n'ala Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere


Chineke nēme ka o si n'Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere: O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya, Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha, Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru.


Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya; Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa: Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa: Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim, Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan