Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 34:3 - Bible Nso

3 Agētufu kwa ndi-ha eb͕uru eb͕u, ma ozu-ha, ísì ọjọ ha gārigo n'elu, agāb͕aze kwa ugwu site n'ọbara-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ. Ozu ha ga-esikwa isi. Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 34:3
20 Iomraidhean Croise  

Ọ bu nání na ọ makpuworo n'ọnọdu onye-nkpọrọ, ọ bu kwa n'ọnọdu ndi eb͕uru eb͕u ka ha gāda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Atu gēso kwa ha rida, umu-oke-ehi kwa, ha na oke-ehi; ala-ha gāṅuju kwa ọbara afọ, agēme kwa ka ájá-ha ma abuba site n'abuba.


Ha gāpu kwa, lekwasi ozu nile nke ndi nējehie ejehie megidem: n'ihi na ikpuru-ha agaghi-anwu, ọku-ha agaghi-anyu kwa; ha gābu-kwa-ra anu-aru nile ihe isọ oyi.


Olìlì nke inyinya-ibu ka agēji lìe ya, agādọrọ ya, tufue ya n'ebe di anya n'azu ọnu-uzọ-ama Jerusalem.


Ndi Jehova b͕uru gādizu kwa n'ubọchi ahu site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa: agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-achikọta kwa ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ.


Ma-ọbu asi na ọ bu ajọ ọria nēfe efe ka M'nēziga n'ala ahu, M'we wukwasi ya ọnumam n'ọbara, ibipu madu na anumanu nime ya:


M'gātusa kwa gi n'ala-gi, n'ọhia ka M'gētufu gi, me kwa ka anu-ufe nile nke elu-igwe bekwasi gi, M'gēme kwa ka anu-ọhia nke uwa nka nile riju afọ site n'anu-aru-gi.


n'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie nání ọbara ka M'gēme gi ka i ghọ, ọbara ganāchu kwa gi: ọ bu ezie na i kpọghi ọbara asì, ma ọbara gāchu gi.


Mu na ya gēkpe kwa ikpe n'ajọ ọria nēfe efe na n'ọbara; ọ bu kwa oké miri-ozuzo nēzobiga ókè, na oké ákú-miri-ígwé, na ọku, na brimstone, ka M'gēme ka ha zokwasi ya, zokwasi kwa usu nile nke ndi-agha-ya, zokwasi kwa ọtutu ndi di iche iche so ya.


O gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gēnye Gog otù ebe ílì ozu n'Israel, bú ndagwurugwu nke ndi-ngabiga n'akuku Iru-anyanwu nke oké osimiri: ihe nēb͕ochibido ndi-ngabiga ka ọ gābu: ha gēlì kwa n'ebe ahu Gog na ìgwè ndi-ya nile: ha ewe kpọ ya, Ndagwurugwu Hamon-Gog.


N'elu ugwu nile nke Israel ka i gāda, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ndi di iche iche ndi nēso gi: udele nile di iche iche na anu ọhia ka M'gēwere gi nye, ka ha we rie gi.


ma M'gēme ka usu-ndi-agha Ugwu ahu si n'aru-unu je n'ebe di anya, M'gāchubà kwa ya n'ala kpọrọ nku na ebe tọb͕ọrọ n'efu, iru-ya n'oké osimiri Iru-anyanwu, na nsọtu-Ya n'oké osimiri Ọdida-anyanwu; ísì ọjọ ya gārigo kwa, e, ísì-ya nke jọb͕uru onwe-ya gārigo, n'ihi na o mewo onwe-Ya uku n'ime ihe.


Ezitewom ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu n'uzọ o si eme n'Ijipt: eb͕uwom umu-okorọbia-unu na mma-agha, ha na inyinya nile unu adọtara n'agha; M'we me ka ísì ọjọ nke ọmuma-ulo-ikwū-unu rigota ọbuná n'imi-unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


na onye-inyinya nēme ka inyinya-ya rigo, na mma-agha nēb͕upu eb͕upu, na ube nēb͕u àmùmà; na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u, na oké obo ozu; ọ dighi kwa ọgwugwu diri ozu-ha; ha nāsu ngọngọ n'ozu-ha:


Ewe zọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu n'azu obodo ahu, ọbara we si n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu puta, rue bridle inyinya, ru kwa ihe ra ka nnù furlong anọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan