Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 34:1 - Bible Nso

1 Bianu nso, unu mba, inu ihe; unu ndi di iche iche kwa, ṅanu nti: ka uwa nu, ya na ùjú-ya; elu-uwa dum madu bi, na ihe nile si nime ya aputa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Bịanụ nso, unu ndị mba niile, ṅaa ntị. Geenụ ntị, unu mba niile nke ụwa. Ka ụwa na ihe niile dị nʼime ya, na ihe niile na-esi nʼime ya apụta nụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 34:1
25 Iomraidhean Croise  

Chineke we si Noa, Ọgwugwu anu-aru nile abiawo n'irum; n'ihi na uwa juputara n'ihe-ike site na ha; ma, le, M'gēbibi ha na uwa.


Jehova nwe uwa na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya.


Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo, We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya.


Sinu n'etiti mba nile, Jehova bu eze: Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Ọ gēkpe ndi nile di iche iche ikpe n'izi-ezi.


Nurunu, elu-igwe, gi uwa, ṅa kwa nti, n'ihi na Jehova ekwuwo okwu: umu ka M'meworo ka ha toputa, emewokwam ka ha di elu, ma umu ahu ejehiewo megidem.


Unu ndi nile nēbi n'elu-uwa dum madu bi, na unu ndi nwere ebe-obibi-unu n'uwa, mb͕e anēbuli ọkọlọtọ n'elu ugwu nile, hunu; ọzọ mb͕e anāfù opi-ike, nurunu,


Unu ndi nọ n'ebe di anya, nurunu ihe M'meworo; unu kwa ndi nọ nso, maranu idi-ikem.


B͕anu nkiti gem nti, unu agwe-etiti; ka ndi nile di iche iche b͕anwe kwa ike-ha: ka ha biarue nso; ka ha kwue okwu: ka ayi biarue onwe-ayi nso ikpe ikpe.


Achikọtawo mba nile n'otù, kpọkọta kwa ndi nile di iche iche: ònye n'etiti ha gēgosi nka, me ka ayi nuru ihe mbu nile? Ka ha weputa ndi-àmà-ha, ka ewe gua ha na ndi ezi omume: ma-ọbu ka ha nuru, si, Ezi-okwu.


Biakutenum nso, nurunu nka; site na mb͕e mbu ọ bughi na nzuzo ka M'kwuworo okwu; site na mb͕e ọdidi-ya, n'ebe ahu ka M'nọ: ma ub͕u a Onye-nwe-ayi Jehova ezitewom, mu na Mọ-Ya.


Genum nti, unu agwe-etiti; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi di iche iche, site n'ebe di anya: Jehova esitewo na mb͕e m'nọ n'afọ kpọm; site na mb͕e m'nọ n'afọ nnem ka O hotaworo aham:


Ònye bu nka nēsi n'Edom bia, yiri uwe nācha ọbara-ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara nma n'uwe-oyiyi-Ya, nāzọ ije n'iba-uba nke ike-Ya? Ọ bu Mu onwem nke nēkwu okwu n'ezi omume, di ike izọputa.


Ala, ala, ala, nuru okwu Jehova.


Nke diri Edom. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Amam-ihe, ọ̀ dighi kwa na Timan ọzọ? ndum-ọdu, ọ̀ lanariwo ndi-nghọta n'iyì? amam-ihe-ha, àwusiwo ya?


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye ahu nke M'kwuru okwu bayere ya na mb͕e ochie site n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma Israel, ndi nēbu amuma n'ubọchi ahu ọtutu arọ, si, na M'gēme ka i biakwasi ha?


Ọhù Obadaia. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri bayere Edom: Ayi anuwo ihe-ọnunu sitere n'ọnu Jehova, ezigawo kwa ukọ̀ n'etiti mba nile, si, Bilienu, ka ayi bilie imegide ya n'agha.


n'ihi na uwa bu nke Onye-nwe-ayi, na ùjú-ya.


Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m'kwu kwa ihe; Ka uwa nu kwa okwu ọnum:


emewom ka elu-igwe na uwa b͕agide unu àmà ta, na unu gālapusi n'iyì ngwa ngwa n'ala ahu nke unu nāgabiga Jọdan ibà n'ebe ahu inweta ya; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ya, kama agēkpochapu unu ekpochapu.


Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o rie nkpuru si n'osisi nke ndu ahu puta, bú nke di na Paradais nke Chineke.


Nurunu, ndi-eze; ṅanu nti, ndi-isi; Mu onwem gābùku Jehova abù, ọbuná mu onwem; M'gābùku Jehova, bú Chineke nke Israel, abù ọma.


Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n'iyi, Jehova: Ma ndi nāhu Ya n'anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n'ike-ya. Ala we di jū ọgu arọ abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan