Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 33:4 - Bible Nso

4 Agāchikọta kwa ihe-unu akwatara n'agha dika nchikọta nke ọbubu: dika nb͕aghari nke igurube, otú a ka ọ nāb͕aghari n'elu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi, otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 33:4
11 Iomraidhean Croise  

Esa na ndi ya na ha nọ we chua ha rue Gera: ọtutu nime ndi Etiopia we da, idebe-ndu we ghara idiri ha; n'ihi na etipiara ha n'iru Jehova na n'iru ọmuma-ulo-ikwū-Ya; ha we būru ihe-nkwata nke bara uba nke-uku.


Jehoshafat na ndi-ya we bia iluta ihe-nkwata-ha n'agha, ha we hu n'etiti ha ma àkù ma ozu ma ihe di oké ọnu-ahia n'uba, ha we napusia onwe-ha ihe, kari nke ha nwere ike ibū: ha we nọ ubọchi atọ nāluta ihe-nkwata n'agha, n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu.


Atọsawo udọ̀-gi nile; ha adighi-ejisi ukwu akpu-ha ike, ha ab͕asaghi ọkọlọtọ-ha: mb͕e ahu ekesara ihe alutara n'agha, bú ihe akwatara n'uba; ndi-ngwurọ lutara ihe-nluta-n'agha.


Site n'olu ùzù ka ndi di iche iche b͕alagaworo; site na nbuli-Gi ka mba nile b͕asaworo.


Jehova di elu; n'ihi na O bi n'elu: O mejuwo Zaion n'ikpe ziri ezi na ezi omume.


n'ihi nka, le, Mu onwem esetiwo akam n'aru gi, M'gēwere kwa gi nye ka i ghọrọ mba nile ihe-nluta-n'agha; M'gēbipu kwa gi n'aru ndi nile di iche iche, me ka i si n'ala nile la n'iyì: M'gēkpochapu gi: i we mara na Mu onwem bu Jehova.


Ihe palmer-worm rifọworo ka igurube riworo; ihe igurube rifọworo ka ukpala riworo; ihe ukpala rifọworo ka ọbubu riworo.


M'gākwughachi kwa unu arọ nile nke igurube na ukpala na ọbubu na palmer-worm riworo, bú oké usu-ndi-agham nke M'zitere n'etiti unu.


N'iru ha ka ọku nēripia ihe; ọ bu kwa n'azu ha ka ire-ọku nēsuye ọku esuye: dika ubi ahu ab͕ara ogige, bú Iden, ka ala di n'iru ha, n'azu ha ọ bu ọzara tọb͕ọrọ n'efu; e, ọ dighi kwa ihe ọ bula b͕apuworo n'aka-ha.


N'obodo ka ha nāb͕aghari; n'elu mb͕idi ka ha nāb͕a ọsọ; n'ulo ka ha nārigobata; ha si na window nile abà nime dika onye-ori.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan