Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 32:18 - Bible Nso

18 Ndim gānọ kwa n'ulo-obibi udo, na n'ebe-obibi di iche iche kwesiri ntukwasi-obi, na n'ebe-izu-ike di iche iche di jū.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ndị m ga-ebi nʼebe obibi nke udo, nʼụlọ nwere ezi nchekwa, nʼebe izuike nke nsogbu na-adịghị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 32:18
26 Iomraidhean Croise  

O me-kwa-ra ka ha zọ ije n'uzọ ziri ezi, Ijeru obodo obibi.


Nání n'ala Goshen, ebe umu Israel nọ, ka ákú-miri-ígwé nādighi.


Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume; Apunarala ya ebe-izu-ike-ya:


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na nkpọrọgwu Jesi, nke nēguzo ibu ọkọlọtọ ndi nile di iche iche, ya ka mba nile gāju ase; ebe-izu-ike-ya gābu kwa ebube.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi Jehova gēme ka i zu ike pua n'ihe-nb͕u-gi, na n'ihe-nwute-gi, na n'òfùfè ahu siri ike nke emere ka i fè nime ya,


Ọ gēkpe kwa ikpe n'etiti mba nile, dozi-kwa-ra ọtutu ndi di iche iche okwu-ha: ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ.


Jehova, I gēdoro ayi udo: n'ihi na ọ bu kwa ọlu nile nke ayi ka I luworo ayi.


I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n'udo: n'ihi na ọ bu Gi ka o nātukwasi obi.


bú Onye siri ha, Nka bu izu-ike ahu, menu ka onye ike gwuru zuru ike; nka bu kwa igba ume ahu: ma ha ekweghi inu.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, siri, Nime nlata na izu-ike ka agāzọputa unu; n'inọ-jū na n'itukwasi-obi ka idi-ike-unu gādi: ma unu ekweghi.


Ikwesi-ntukwasi-obi gādi kwa na mb͕e-gi nile, iba-uba nke nzọputa na amam-ihe na ihe-ọmuma: egwu Jehova, nke ahu bu àkù-ya.


Ha gēwu kwa ulo, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, rie nkpuru-ha.


M'gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M'rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n'ebe ahu.


N'ubọchi ahu ka agāzọputa Juda, Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha nke agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi.


Ha agaghi-abu-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n'agha ọzọ, anu-ọhia nke uwa agaghi-eri kwa ha; ma ha gēbi na ntukwasi-obi, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji.


N'ihi na Mu onwem gāburu ya mb͕idi ọku buruburu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa ebube ka M'gāghọ n'etiti ya.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n'ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya.


N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka unu gākpọbata, onye ọ bula ọ kpọbata madu-ibe-ya, n'okpuru osisi vine na n'okpuru osisi fig.


Ya mere idebe-ubọchi-izu-ike fọduru ndi nke Chineke.


Ayi onwe-ayi amawo kwa ihu-n'anya ahu, ayi ekwerewo kwa na ya, bú nke Chineke nwere n'ebe ayi nọ. Chineke bu ihu-n'anya; onye nānọgide kwa n'ihu-n'anya; nime Chineke ka ọ nanọgide Chineke nānọgide kwa nime ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan