Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 32:15 - Bible Nso

15 rue mb͕e agāwukwasi ayi Mọ site n'elu, ọzara ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n'oké ọhia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ha niile ga-adịgide otu a tutu ruo mgbe a ga-esite nʼeluigwe wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ. Mgbe ahụ ọzara ga-aghọ ala ubi mara mma, ala ubi ọma ahụ ga-adịkwa ka ọhịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 32:15
29 Iomraidhean Croise  

I nēzipu Mọ-Gi, ekè ha; I we me ka iru ala di ọhu.


O nēme ka osimiri ghọ ọzara, O nēme kwa ebe miri nāsuputa ka ha ghọ ala kpọro nku;


Ọ nēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri, Ọ nēme kwa ka ala nke kpọrọ nku ghọ ebe miri nāsuputa.


Laghachinu n'iba-nbam: Le, m'gāwupuru unu mọm, M'gēme ka unu mara okwum nile.


Ọ gāghọ-kwa-ra onye nānọkwasi n'oche ikpé mọ nke ikpé, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi nāchughachi ndi nēbu agha rue ọnu-uzọ-ama idi-ike.


Ọ̀ bughi nwa mb͕e ntà fọduru, Lebanon ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n'oké ọhia?


Mirage gāghọ kwa ọdọ-miri, ala miri nādighi gāghọ kwa isi-iyi juputara na miri: n'ebe-obibi nkita-ọhia, ebe ha nāmakpu amakpu, ogige nke diri amì na papyrus.


N'ihi na M'gāwukwasi miri n'aru onye akpiri nākpọ nku, na ọtutu miri-iyi n'ala-akọrọ: M'gāwukwasi Mọm n'aru nkpuru-gi, na ngọzim n'aru umu i muru:


Unu elu-igwe, nātasinu ezi omume site n'elu, ka mbara-ígwé nile nēzoda kwa ezi omume dika miri: ka ala meghe onwe-ya, ka ha we mia nzọputa dika nkpuru, ka o me kwa ezi omume ka ọ pukọ n'otù; Mu onwem, bú Jehova, ekèwo ya.


Ha gātu kwa egwu aha Jehova site n'Ọdida-anyanwu, tu kwa egwu ebube-Ya site n'ọwuwa anyanwu: mb͕e onye-nkpab͕u gābata dika miri-iyi, Mọ nke Jehova ganēbuli ọkọlọtọ imegide ya.


Ma Mu onwem, nka bu ọb͕ub͕a-ndum nke di n'etiti Mu na ha, ka Jehova siri: Mọm nke di n'aru gi, na okwum nile nke M'tiyeworo n'ọnu-gi, agaghi-apu n'ọnu-gi, na n'ọnu nkpuru-gi, na n'ọnu nkpuru nke nkpuru-gi, ka Jehova siri, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.


Ndi-Ya we cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga nke Moses, si, Òle ebe Onye ahu nọ nke mere ka ha si n'oké osimiri rigoputa n'aka onye nāzù ìgwè ewu na aturu-Ya? òle ebe Onye ahu nọ nke tiyere Mọ Nsọ Ya n'etiti ha?


M'gētiye kwa Mọm nime unu, unu ewe di ndu, M'gēme kwa ka unu nọdu n'ala-unu: unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gaghi-ezonari kwa ha irum ọzọ: n'ihi na awukwasiwom Mọm n'ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.


Le kwa, Mu onwem nēziputa nkwà nke Nnam n'isi-unu: ma nọdunu n'obodo a, rue mb͕e agēwere ike nke si n'elu yikwasi unu.


Ma nka ka O kwuru bayere Mọ Nsọ, Nke ndi kwere na Ya gaje inara: n'ihi na akēnyeghi Mọ Nsọ; n'ihi na akēnyeghi Jisus otuto.


Ya mere, ebe eweliri Ya elu site n'aka-nri Chineke, ebe Ọ nata-kwa-ra n'aka Nna-Ya nkwà ahu, bú Mọ Nsọ, Ọ wusara nka unu onwe-unu nāhu nānu kwa.


ìje-ozi nke Mọ Nsọ gēsi aṅa ghara idi kari n'ebube?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan