Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 31:9 - Bible Nso

9 Nkume-ya nke di elu gāgabiga site n'ujọ, ndi-isi-ya gātu kwa ujọ ọkọlọtọ, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Onye ìhè O nwere di na Zaion, ite-ọku uku O nwere di kwa na Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Obodo ha niile e wusiri ike ga-ada nʼihi oke egwu, ndị ọchịagha ha ga-atụkwa ụjọ mgbe ha hụrụ ọkọlọtọ agha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. Onye ọkụ ya dị na Zayọn, onye ekwu igwe ọkụ ya dị na Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 31:9
20 Iomraidhean Croise  

N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, gēziga ọtita-aru n'etiti ndi-ya mara abuba: ọ bu kwa n'okpuru nsọpuru-ya ka agāmuye nmuye dika nmuye nke ọku.


Ìhè Israel gāghọ kwa ọku, Onye Nsọ ya gāghọ kwa onwunwu-ọku, we re ọku richapu uke-ya na ogwu-ya n'otù ubọchi.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na nkpọrọgwu Jesi, nke nēguzo ibu ọkọlọtọ ndi nile di iche iche, ya ka mba nile gāju ase; ebe-izu-ike-ya gābu kwa ebube.


Bulienu ọkọlọtọ n'elu ugwu nke osisi nādighi, welierenu ha olu, fenu aka, ka ha we ba n'ọnu-uzọ nile nke ndi amara aha-ha.


Mba di iche iche, dika nkpọtu nke miri di ike ka ha nākpọtu: ma Ọ nābasiri ya nba ike, o we b͕alaga n'ebe di anya, anāchi kwa ya dika ib͕ob͕o-ọka nke ugwu n'iru ifufe, na dika ihe anēfeghari buruburu n'iru oké ifufe.


Unu ndi nile nēbi n'elu-uwa dum madu bi, na unu ndi nwere ebe-obibi-unu n'uwa, mb͕e anēbuli ọkọlọtọ n'elu ugwu nile, hunu; ọzọ mb͕e anāfù opi-ike, nurunu,


N'ubọchi ahu ka agābù abù a n'ala Juda: Obodo siri ike ka ayi nwere; nzọputa ka O gēdo ka ọ buru mb͕idi-ya nile na ékpè-ya.


Ọ̀ bu dika ntib͕u nke onye nētib͕u ya-ri ka O tib͕uworo ya? ma ọ̀ bu dika ob͕ub͕u nke ndi o nēb͕uri ka eb͕uworo ya?


Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēji éb͕è-elu-igwe, ji kwa ala-ọma-jijiji, na oké olu, na oké ifufe na ikuku uku, na ire-ọku nke -ọku nērichapu erichapu, leta ya.


N'ihi na edowo otù Tofet n'usoro site na mb͕e gara aga; e, nke ahu ka edoziworo nye eze; O mewo ya ka ọ di omimi, me ya ka ọ sa mbara: obo-ya bu ọku na ọtutu nkú; nku-ume Jehova, dika iyi brimstone, nāfunwu ya.


Senakerib, bú eze Asiria, we bulie ije, je, laghachi, biri na Nineve.


mb͕e Onye-nwe-ayi gāsachapuwori inyi umu-ndinyom Zaion, ṅachapu kwa ọbara Jerusalem n'etiti ya, site na Mọ nke ikpé, na site na Mọ nke nkpochapu.


O we weliere mba ndi sitere n'ebe di anya ọkọlọtọ, kpọkọta ya òkù site na nsọtu uwa: ma, le, ọ nēme ngwa bia ọsọsọ:


N'ihi na, le, Jehova gēji ọku bia, ub͕ọ-ala-Ya nile gādi kwa ka oké ifufe; iji ọnuma nyeghachi iwe-Ya, na iji ire ọku nyeghachi ibasi-nba-ike-Ya.


Mb͕e dum ka agēme ka ọku nēre ere n'elu ebe-ichu-àjà; ọ gaghi-anyu anyu.


N'ihi na Mu onwem gāburu ya mb͕idi ọku buruburu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa ebube ka M'gāghọ n'etiti ya.


N'ihi na, le, ubọchi ahu nābia, ọ nēre dika ite-ọku uku; ndi-nganga nile na onye ọ bula nke nēme ihe-nmebi-iwu gābu kwa ahihia-ọka: ubọchi ahu nke nābia gērechapu ha, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ọ gaghi-arapu-kwa-ra ha nkpọrọgwu ma-ọbu alaka.


N'ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi, Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe.


Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ? Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan