Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 31:3 - Bible Nso

3 Ma ndi Ijipt bu madu, ha abughi Chineke; inyinya-ha bu kwa anu-aru, ha abughi mọ: Jehova gēseti kwa aka-Ya, onye nēye aka ewe su ngọngọ, onye anēyere aka adà kwa, ọ bu kwa n'otù ka ha nile gāgwusi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke! Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ. Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha, ha ga-asọ ngọngọ; ndị ha na-enyere aka ga-adakwa. Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 31:3
25 Iomraidhean Croise  

nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n'elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda.


Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi madu obi.


Nání ihe-nrafu ka inyinya bu iji zọputa madu: Ọ dighi-eji kwa ike-ya riri nne me ka madu wepuga onwe-ya.


Jehova, doro ha ihe-egwu: Ka mba nile mara na nání madu ka ha bu. Selah


Ọ̀ bu kwa gini ka unu gēme n'ubọchi nleta, na n'ila-n'iyì nke gēsi n'ebe di anya bia? Ònye ka unu gāb͕akuru ka o we yere unu aka? ọ̀ bu kwa ole ebe unu gārapu nsọpuru-unu?


otú a ka eze Asiria gēdulaga ndi Ijipt adọtara n'agha, na ndi Etiopia emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma umu ntà ma ndi-okenye, b͕ara ọtọ na ukwu efu, b͕a kwa ọtọ n'otule, ib͕aba Ijipt ọtọ.


Onye bi n'akuku oké osimiri nka gāsi kwa n'ubọchi ahu, Le, otú a ka ihe-ntukwasi-obi-ayi di, ebe ayi b͕alagaworo ka ewe yere ayi aka inaputa ayi n'aka eze Asiria: òle ebe kwa ka ayi onwe-ayi gēwepuga onwe-ayi?


Kama unu siri, É-è, n'ihi na inyinya ka ayi gānọkwasi b͕alaga; n'ihi nka unu gāb͕alaga: unu si-kwa-ra, Anu di ngwa ka ayi gānọkwasi; n'ihi nka ka ndi nāchu unu gādi ngwa.


Ha nile gēme ihere otù ndi nādighi-abara ha urù, ndi nābughi ihe iye aka, nābughi kwa ihe iba urù, kama ha bu ihe-ihere, ọzọ kwa, ha bu ihe-ita-uta.


Ma Ijipt, nání otù nku-ume na ihe-efu ka iye-aka-ha bu: n'ihi nka ka M'kpọworo ala nka Rehab, ndi ahu bu nkwusi.


Le, i tukwasiwo obi n'aru nkpa-n'aka amì a piara apia, bú n'aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n'ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n'ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ.


Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n'aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya?


N'ihi nka Onye-nwe-ayi agaghi-aṅuri ọṅu n'aru umu-okorọbia-ha, Ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru umu-nb͕ei-ha na ndinyom-ha di-ha nwuru: n'ihi na onye ọ bula nime ha bu onye emeruru emeru na onye nēme ihe ọjọ, ọnu ọ bula nēkwu kwa ihe-nzuzu. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Gi onwe-gi arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), azu ka i nālaghachi: M'we setipu akam imegide gi, we bibie gi; ike ncheghari agwusiwom.


Otú a ka Jehova siri: Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, we me ka anu-aru, bú madu, buru ogwe-aka-ya, onye obi-ya nēsi kwa n'ebe Jehova nọ wezuga onwe-ya.


Nwa nke madu, si onye-ndú Taia, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na obi-gi adiwo elu, i we si, Chi ka m'bu, n'ọnọdu Chineke ka m'nānọkwasi, n'etiti oké osimiri nile; ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, i we do obi-gi ka obi Chineke:


Ì gāsi n'ezie, Chineke ka m'bu, n'iru onye nēb͕u gi? ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, n'aka onye nēme gi ka i ghara idi nsọ.


onye nāchi uta agaghi-eguzo kwa; onye ukwu-ya abua di nfe n'ib͕a ọsọ agaghi-ewepuga kwa onwe-ya: onye nānọkwasi n'inyinya agaghi-ewepuga kwa onwe-ya:


Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan